Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/07 p. 1
  • ‘Kwuo Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Kwuo Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Jiri Nkwuwa Okwu Kpọsaa Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ị̀ Na-eji Nkwuwa Okwu Eme Nkwusa?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 4/07 p. 1

‘Kwuo Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’

1 Egwu ọ̀ na-atụ gị mgbe ụfọdụ ikwu banyere ihe ndị i kweere ma ohere pụtara gị ikwu ya n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ? Ọ̀ na-esiri gị ike ịgbara ndị ikwu gị na ndị agbata obi gị, ma ọ bụ ikekwe ndị ị na-amabughị, àmà mgbe ị na-anọghị n’ozi? Gịnị ga-enyere anyị nile aka iji ohere ọ bụla dapụtaranụ ‘kwuo okwu Chineke n’atụghị egwu’?—Fil. 1:14.

2 Alala Azụ: Ị̀ ga-ala azụ ịgbachitere enyi gị ma ọ bụ onye ikwu gị nke e boro ebubo ụgha? Kemgbe ọtụtụ narị afọ, e kwuola ihe ndị na-abụtụghị eziokwu banyere ezigbo Enyi anyị, bụ́ Jehova. Anyị nwere nnọọ ihe ùgwù nke ịgbara Chineke anyị dị ebube àmà! (Aịsa. 43:10-12) Ezigbo ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ pụrụ ime ka anyị ghara ịdị na-echegbu onwe anyị ma ọ bụ na-atụ ụjọ, ọ pụkwara ịkpali anyị iji obi ike kwuo okwu Chineke kama ịgbachi nkịtị.—Ọrụ 4:26, 29, 31.

3 Cheta na ozi anyị bụ ozi ọma. Ọ ga-abara ndị nabatara ya uru n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’uru ozi ọma ahụ bara kama ilekwasị anya n’ebe anyị onwe anyị nọ ma ọ bụ n’ebe ndị na-emegide anyị nọ, nke a ga-enyere anyị aka iji obi ike na-ekwusa ya.

4 Ihe Nlereanya nke Ndị Ọzọ: Anyị pụrụ inweta ike site n’ihe nlereanya nke ndị kwuru okwu Chineke n’atụghị egwu. Dị ka ihe atụ, Ịnọk ji obi ike kpọsaa ikpe Jehova megide ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke. (Jud 14, 15) Noa ji ikwesị ntụkwasị obi zie ndị na-enweghị mmasị ozi ọma. (Mat. 24:37-39) Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, bụ́ ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,” nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ha nwetara. (Ọrụ 4:13, 18-20) Ọtụtụ mgbe, Ụlọ Nche na Teta! na-ebu akụkọ ndụ nke ndị nke oge anyị a, bụ́ ndị na-atụghị ụjọ mmadụ kama ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ahụ n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi.

5 Anyị pụrụ inweta obi ike site n’ịtụle ụzọ ndụ nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie bụ́ ndị zutere ọnọdụ ndị tara akpụ. (1 Ikpe 19:2, 3; Mak 14:66-71) Ha ‘nwere nkwuwa okwu site na Chineke anyị’ ma kwuo okwu n’atụghị egwu. Anyị nwekwara ike ime otú ahụ!—1 Tesa. 2:2.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya