‘Kwuo Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’
1 Egwu ọ̀ na-atụ gị mgbe ụfọdụ ikwu banyere ihe ndị i kweere ma ohere pụtara gị ikwu ya n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ? Ọ̀ na-esiri gị ike ịgbara ndị ikwu gị na ndị agbata obi gị, ma ọ bụ ikekwe ndị ị na-amabughị, àmà mgbe ị na-anọghị n’ozi? Gịnị ga-enyere anyị nile aka iji ohere ọ bụla dapụtaranụ ‘kwuo okwu Chineke n’atụghị egwu’?—Fil. 1:14.
2 Alala Azụ: Ị̀ ga-ala azụ ịgbachitere enyi gị ma ọ bụ onye ikwu gị nke e boro ebubo ụgha? Kemgbe ọtụtụ narị afọ, e kwuola ihe ndị na-abụtụghị eziokwu banyere ezigbo Enyi anyị, bụ́ Jehova. Anyị nwere nnọọ ihe ùgwù nke ịgbara Chineke anyị dị ebube àmà! (Aịsa. 43:10-12) Ezigbo ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ pụrụ ime ka anyị ghara ịdị na-echegbu onwe anyị ma ọ bụ na-atụ ụjọ, ọ pụkwara ịkpali anyị iji obi ike kwuo okwu Chineke kama ịgbachi nkịtị.—Ọrụ 4:26, 29, 31.
3 Cheta na ozi anyị bụ ozi ọma. Ọ ga-abara ndị nabatara ya uru n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’uru ozi ọma ahụ bara kama ilekwasị anya n’ebe anyị onwe anyị nọ ma ọ bụ n’ebe ndị na-emegide anyị nọ, nke a ga-enyere anyị aka iji obi ike na-ekwusa ya.
4 Ihe Nlereanya nke Ndị Ọzọ: Anyị pụrụ inweta ike site n’ihe nlereanya nke ndị kwuru okwu Chineke n’atụghị egwu. Dị ka ihe atụ, Ịnọk ji obi ike kpọsaa ikpe Jehova megide ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke. (Jud 14, 15) Noa ji ikwesị ntụkwasị obi zie ndị na-enweghị mmasị ozi ọma. (Mat. 24:37-39) Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, bụ́ ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,” nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ha nwetara. (Ọrụ 4:13, 18-20) Ọtụtụ mgbe, Ụlọ Nche na Teta! na-ebu akụkọ ndụ nke ndị nke oge anyị a, bụ́ ndị na-atụghị ụjọ mmadụ kama ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ahụ n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi.
5 Anyị pụrụ inweta obi ike site n’ịtụle ụzọ ndụ nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie bụ́ ndị zutere ọnọdụ ndị tara akpụ. (1 Ikpe 19:2, 3; Mak 14:66-71) Ha ‘nwere nkwuwa okwu site na Chineke anyị’ ma kwuo okwu n’atụghị egwu. Anyị nwekwara ike ime otú ahụ!—1 Tesa. 2:2.