Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na December 25, 2006. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu November 6 ruo December 25, 2006. [Ihe Ị Ga-arịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee ihe kwesịrị iduzi anyị ma anyị kpebiwe okwu dabara adaba anyị ga-eji ewebata akụkụ Akwụkwọ Nsọ? [be-IB p. 148 para. 4–p. 149 para. 1]
2. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi mesie okwu anyị ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe anyị na-ekwu okwu? [be-IB p. 151 para. 4–p. 152 para. 3]
3. Ebe ọ bụ na ịkụziri ndị ọzọ Okwu Chineke abụghị obere ọrụ, olee ihe a chọrọ anyị n’aka ime ma ọ bụrụ na anyị ga “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi”? (2 Tim. 2:15) [be-IB p. 153 para. 1-3, igbe; p. 154 para. 1-2]
4. Olee ụzọ ndị anyị pụrụ isi mee ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị gụrụ doo anya? [be-IB p. 154 para. 4–p. 155 para. 3]
5. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka e mee ka uru okwu a na-ekwu bara doo anya, oleekwa ụfọdụ ụzọ a pụrụ isi mee nke a? [be-IB p. 157 para. 1-4, igbe; p. 158 para. 1]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee otú o si bụrụ na ọ dịghị “ihe ọhụrụ dị n’okpuru anyanwụ”? (Ekli. 1:9) [w87-IB 9/1 p. 30 para. 4-5]
7. Olee otú ọrụ nke ndị ezi omume si dịrị n’aka Chineke? (Ekli. 9:1) [w87-IB 9/1 p. 31 para. 9-10]
8. Gịnị ka iyi nwa agbọghọ Shulem gbara “ụmụ ndị inyom Jeruselem” ‘ka ha ghara ịkpali ịhụnanya n’ime ya ruo mgbe ọ ga-atọ ya ụtọ,’ na-egosi? (Abụ 2:7; 3:5) [w87-IB 12/15 p. 22 para. 13]
9. Olee ihe ndị na-atụnye ụtụ n’ọchịchịrị ụwa nọ na ya taa? [w01-IB 3/1 p. 13 para. 8-9]
10. Olee ihe pụrụ inyere ọkà okwu aka ka ọ ghara idepụta ihe buru ibu? [be-IB p. 42 para. 2]
ỌGỤGỤ BIBLE DỊỊRỊ IZU
11. Olee otú o si bụrụ na “ndị na-achọ Jehova na-aghọta ihe nile”? (Ilu 28:5)
12. Olee otú ‘ndọgbu ndị nzuzu na-adọgbu onwe ha n’ọrụ si agwụ ha ike’? (Ekli. 10:15)
13. Olee otú nwa agbọghọ Shulem si gosi na ya bụ “ubi a gbara ogige nke a kpachiri akpachi,” oleekwa ezi ihe nlereanya o setịpụụrụ ụmụnna nwanyị ndị na-alụbeghị di? (Abụ 4:12)
14. Mgbe Jehova kpọrọ ụmụ Izrel ka ya na ha kpezie, ọ̀ na-egosi na Jehova dị njikere ka ya na ha kweta ịhapụ ihe ụfọdụ iji mee ka udo dịrị? (Aịsa. 1:18a)
15. Olee otú ihe e kwuru n’Aịsaịa 11:6-9 si mezuo n’oge ochie, oleekwa otú ọ ga-esi mezuo n’ụzọ ka ukwuu?