Mgbanwe Ndị A Na-eme n’Otú A Ga-esi Na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze Agba Akwụkwọ na Nigeria
1 Otu n’ime ihe ndị dị mkpa a na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova eme bụ agbamakwụkwọ. (Jen. 2:24) E wezụga imezu ihe iwu obodo kwuru, e nwere usoro nzukọ Jehova ji eme ihe, nke ndị họọrọ ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ ga-agbaso. N’isiokwu a, e kwuru banyere ụfọdụ mgbanwe ndị a na-eme n’usoro ụfọdụ ndị gbasorola n’oge ndị gara aga.
2 Na Nigeria, Ndịàmà Jehova pụrụ ime otu n’ime ụdị alụmdi na nwunye abụọ e nwere: ya bụ, alụmdi na nwunye ọdịnala ma ọ bụ alụmdi na nwunye Bekee. Ọ bụ ezie na ma iwu obodo ma Akwụkwọ Nsọ kwadochara ụdị alụmdi na nwunye abụọ a, ọ dị mkpa ịghọta na ha abụọ dị iche, na nke ọ bụla n’ime ha zuru ezu. Olee otú ha si dị iche?
3 Alụmdi na Nwunye Ọdịnala: Otú e si alụ nwanyị n’ụzọ omenala n’otu obodo pụrụ ịdị iche n’otú e si alụ ya n’obodo ọzọ. Ma, na Nigeria, ụlọikpe nwere ihe ndị ha nakweere dị ka ihe ndị e ji ama alụmdi na nwunye ọdịnala e mere n’ụzọ iwu kwadoro. Ozugbo a kwụrụ ụgwọ isi nwanyị ma kpọnye nwoke ahụ na-alụ nwanyị nwanyị ahụ, nwoke ahụ na nwanyị ahụ aghọọla di na nwunye ma n’ụzọ iwu obodo kwadoro ma n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro.
4 N’agbanyeghị na iwu kwadoro alụmdi na nwunye ọdịnala a na-edejupụtaghị edejupụta, ka di na nwunye ahụ wee nwee ike inweta ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ, ọ dị mkpa na ha ga-edejupụta alụmdi na nwunye ahụ. Ha idejupụta ya edejupụta ga-eme ka ha na ụmụ ha nwee ike inweta nchebe n’aka gọọmenti. N’ihi ya, ndị okenye kwesịrị ịgbasi Ndị Kraịst na-achọ ịlụ di na nwunye n’ụzọ omenala ume ike ka ha hụ na ha dejupụtara alụmdi na nwunye ha ozugbo ha lụsịrị. Ebe a na-anọkarị eme ndejupụta a bụ n’ụlọ ọrụ ọchịchị ime obodo nke nwere ebe a na-edejupụta alụmdi na nwunye n’ụzọ omenala.
5 Alụmdi na Nwunye Bekee: Alụmdi na nwunye Bekee bụ ụdị alụmdi na nwunye nke abụọ iwu Nigeria kwadoro. N’alụmdi na nwunye Bekee, nwoke ahụ na nwanyị ahụ ọ na-achọ ịlụ na-anọ n’ihu onye e nyere ikike ijikọta di na nwunye kwe nkwa na ha ga-arapagidesi ike n’ahụ́ ibe ha. Ọzọkwa, a ga-enwerịrị, ọ dịkarịa ala, ndị akaebe abụọ. Mmadụ abụọ ahụ a na-ejikọta ịbụ di na nwunye na ndị akaebe ahụ ga-abịanyekwa aka n’akwụkwọ alụmdi na nwunye. N’ụdị alụmdi na nwunye a, ọ bụghị iwu na a ga-enweta nkwado nke ezinụlọ nke ndị ahụ na-achọ ịlụ onwe ha, ọ bụghịkwa iwu na a ga-akwụ ụgwọ isi nwanyị. Ma, na Nigeria, gọọmenti enyela ikike ka a nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ụfọdụ na-eme ụdị alụmdi na nwunye a.
6 Mgbe A Lụrụ Ma n’Ụzọ Omenala Ma n’Ụzọ Ndị Bekee: N’ime afọ ndị garala aga, ihe a na-ahụkarị bụ na ọtụtụ Ndịàmà na-abụ ha lụsịa n’ụzọ omenala, ha agaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze lụọkwa n’ụzọ ndị Bekee. Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ weere ya na ha mere nke Bekee ahụ iji dejupụta nke ahụ ha mere n’ụzọ omenala. Ma, ọ dị mkpa icheta na alụmdi na nwunye ọdịnala na nke Bekee bụ ụdị alụmdi na nwunye abụọ dịcha iche, nakwa na ma iwu obodo ma Akwụkwọ Nsọ kwadochara nke ọ bụla n’ime ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na di na nwunye agaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze lụọ n’ụzọ ndị Bekee mgbe ha lụcharala n’ụzọ omenala, a pụrụ ikwu na ha lụrụ onwe ha ugboro abụọ.
7 Isi ihe anyị na-ekwu bụ na, ọ bụrụ na ọkàikpe ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ e nyere ikike ime otú ahụ ejikọta nwoke na nwanyị dị ka di na nwunye, ma Chineke ma ọgbakọ Ndị Kraịst anabatala alụmdi na nwunye ahụ. Ịga gbawa akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ afọ gasịrị ga-enyewe echiche na Chineke na ọgbakọ Ndị Kraịst anabataghị nke ahụ ọkàikpe mere. Ọzọkwa, ọ bụrụ na nwoke na nwanyị alụọ n’ụzọ omenala, ma Chineke ma ọgbakọ Ndị Kraịst ga-anabata ya. N’ihi ya, o kwesịghị ekwesị, ọ dịghịkwa mkpa ka di na nwunye lụrụla n’ụzọ omenala gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gọọmenti kwadoro ka a nọrọ na-agba akwụkwọ, lụọkwa n’ụzọ ndị Bekee.
8 Ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Alụ Di na Nwunye n’Ụzọ Ndị Bekee: N’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị e kwurula, ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ma di na nwunye lụrụla n’ụzọ omenala gaa lụghachi onwe ha site n’ịga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze lụọ n’ụzọ ndị Bekee. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị di na nwunye ahụ ka e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a pụrụ ime ndokwa maka ya. Mgbe okwu ahụ na-aga n’ihu, ha ekwesịghị ime ihe ụfọdụ a na-eme n’alụmdi na nwunye Bekee, dị ka idejupụta akwụkwọ alụmdi na nwunye. Ọ ga-adị mkpa ka ndị ọ bụla na-achọ ịlụ di na nwunye kpebie ụdị alụmdi na nwunye ha ga-eme, ma ọ̀ ga-abụ nke ọdịnala ka ọ̀ ga-abụ nke Bekee. Otu ihe ọ dị mkpa ka e buru n’uche bụ na ma iwu obodo ma Akwụkwọ Nsọ kwadochara nke ọ bụla n’ime ha.
9 N’ihi nke a, a gaghịzi na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị na Nigeria alụ di na nwunye n’ụzọ ndị Bekee mgbe di na nwunye ahụ lụcharala n’ụzọ omenala. Ọ bụrụ na nwoke na nwanyị alụọ n’ụzọ omenala, ọ gaghị adị mkpa ka ha gaa n’ụlọ ọrụ ọchịchị ime obodo lụọkwa n’ụzọ ndị Bekee. Ọ bụrụ na nwoke na nwanyị ahụ lụrụla n’ụzọ omenala ahọrọkwa ịga n’ụlọ ọrụ ọchịchị ime obodo (ọ bụghị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze) lụọkwa n’ụzọ ndị Bekee, nke ahụ bụ mkpebi nke aka ha. Na ha gara lụọkwa n’ụzọ ndị Bekee emeghị ka alụmdi na nwunye ahụ bụrụkwuo nke iwu kwadoro. Ha mee otú ahụ, ọ gaghịzi adị mkpa ime ndokwa ka e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ ma ọ bụkwanụ mee ndokwa maka oriri na nkwari. N’aka nke ọzọ, ọ gaghị adị mma ma ọ bụ dị mkpa ka di na nwunye lụghachi onwe ha n’ụzọ omenala mgbe ha lụsịrịla n’ụzọ ndị Bekee.
10 Okwu Dabeere na Bible: Ọ bụrụ na di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst alụsịa n’ụzọ omenala ma ọ bụ n’ụzọ ndị Bekee ma chọọ ka e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ dị mfe nke ga-adabere na Bible, ha pụrụ ịnata òtù ndị okenye nke ọgbakọ ha ikike ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha mee ya, ma Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ò so ná ndị gọọmenti kwadoro ka a nọrọ na-agba akwụkwọ ma ọ bụ na o soghị. Ọ bụrụ na a ga-eme ya otú ahụ, ọ “ga-abụ ihe amamihe ịghara ikwe ka e nwee ọtụtụ ụbọchị” n’agbata ụbọchị a ga-agba akwụkwọ ahụ na ụbọchị a ga-ekwu okwu agbamakwụkwọ ahụ. (w97-IB 4/15 p. 24, para. 1) Ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na e kwuru okwu ahụ a ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’otu ụbọchị ahụ di na nwunye ahụ lụrụ n’ụzọ omenala ma ọ bụ n’ụzọ ndị Bekee, ma ọ bụkwanụ n’echi ya. Ọ bụrụ na a gbasịrị akwụkwọ ma chere ruo ọtụtụ ụbọchị tupu e kwuwe okwu agbamakwụkwọ ahụ, ọ ga-adị ka okwu ahụ enwechaghị isi. Okwu agbamakwụkwọ ahụ kwesịrị ịdị ùgwù, dị nsọpụrụ, bụrụkwa nke a ga-eji kpọrọ ihe. O kwesịrị ịdabere n’Akwụkwọ Nsọ, o kwesịkwara ikpo ọkụ ma gbaa di na nwunye ahụ nakwa ndị ọzọ bịaranụ ume n’ụzọ ime mmụọ. Tụkwasị na nke ahụ, ndokwa ndị e mere banyere okwu agbamakwụkwọ a ekwesịghị ime ka ndị mmadụ chewe na a na-eme agbamakwụkwọ nke abụọ.
11 Mmadụ nile nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ghọtara na alụmdi na nwunye bụ ndokwa dị nsọ. Ya mere, ma nwoke na nwanyị hà họọrọ ịlụ n’ụzọ omenala ma hà họọrọ ịlụ n’ụzọ ndị Bekee, ha kwesịrị ịgbalịsi ike ịhụ na ‘ee ha kwuru bụ ee’ ma a bịa ná nkwa ọlụlụ ha kwere onwe ha. (Mat. 5:37; 19:6) Mgbe e lere alụmdi na nwunye anya n’ụzọ dị “nsọpụrụ” otú ahụ, ọ ga-eme ka e too aha Jehova ma gbasoo ụkpụrụ ndị dị elu O setịpụrụ banyere alụmdi na nwunye.—Hib. 13:4.