Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na June 26, 2006. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu May 1 ruo June 26, 2006. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Gịnị bụ mgbanwe ụda olu, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa? [be-IB p. 111, igbe abụọ]
2. Olee otú anyị pụrụ isi na-agbanwe ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ anyị mgbe anyị na-ekwu okwu? [be-IB p. 112 para. 3-6, igbe]
3. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ihe anyị na-ekwu dị anyị ọkụ n’obi, gịnịkwa mere nke a ji dị mkpa? [be-IB p. 115 para. 1–p. 116 para. 2, igbe abụọ]
4. Mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, gịnị mere iji mmetụta na-ekwu okwu ji dị mkpa, gịnịkwa pụrụ inyere anyị aka ime nke a? [be-IB p. 118 para. 3–p. 119 para. 5]
5. Kọwaa otú mmegharị ahụ́ na ọdịdị ihu si dị mkpa ná nkwurịta okwu. (Mat. 12:48, 49) [be-IB p. 121, igbe abụọ]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee otú anyị sirila rite uru n’ihe e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ banyere Job? [w94-IB 11/15 p. 20 para. 21]
7. Olee otú ebere Chineke si “dị mma karịa ndụ”? (Ọma 63:3) [w86-IB 10/15 p. 27 para. 4, 5]
8. Mgbe akwụkwọ Ilu 13:16 na-ekwu banyere onye nwere ezi uche, ọ̀ na-ekwu banyere onye dị aghụghọ? Kọwaa. [w04-IB 7/15 p. 28 para. 3-4]
9. Olee otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ dị ka ihe inyeaka, gịnịkwa ka nke a kwesịrị ịgba anyị ume ime? (Jọn 14:25, 26) [be-IB p. 19 para. 2-3]
10. N’echiche dị aṅaa sara mbara ka Jizọs bịara, oleekwa ‘ọbịbịa’ ọ na-ekwu banyere ya na Matiu 16:28? [w04-IB 3/1 p. 16 igbe]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ihe Job zara Jehova na Job 42:1-6?
12. “Ihe efu” dị aṅaa ka mba nile na-atụgharị n’uche? (Ọma 2:1, 2)
13. Olee ide ndị a na-akwada? (Ọma 11:3)
14. Olee otú e si ‘akwụghachibiga onye mpako ụgwọ ọrụ ókè’? (Ọma 31:23)
15. Okwu nkasi obi ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịchọta n’Abụ Ọma nke 40 bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka ịnagide ezughị okè nke anụ ahụ́ anyị na-emehie emehie na nhụjuanya dịgasị iche iche a na-enwe n’usoro ihe a? (Ọma 40:1, 2, 5, 12)