Otú E Si Anọgide Na-anụ Ọkụ n’Obi
1 Ịnụ ọkụ n’obi Apọlọs ji jee ozi ya nwere ike ichetara anyị banyere Ndị Kraịst ibe anyị taa, bụ́ ndị ji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 18:24-28) Ma, a na-agba anyị nile ume, sị: “Unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme. Na-anụnụ ọkụ na mmụọ.” (Rom 12:11) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịmụta ịnụ ọkụ n’obi n’ozi Ndị Kraịst ma nọgide na-eme otú ahụ?
2 Ịnụ Ọkụ n’Obi nke Ihe Ọmụma Kpaliri: Mgbe Jizọs mesịrị ka mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya ma “kọwaara ha ihe ndị metụtara ya onwe ya n’ime Akwụkwọ Nsọ dum,” ha kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ ka ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ?” (Luk 24:27, 32) N’otu aka ahụ, ọ̀ bụ na obi adịghị ekporo anyị ọkụ mgbe anyị ghọtakwuru Okwu Chineke nke ọma? Ee, ihe ọmụma na-akpali anyị inwe okwukwe. Ndị Rom 10:17 na-akọwa, sị: “Okwukwe na-esochi ihe a na-anụ.” Obi sihaala anyị ike ná nkwa ndị Jehova kwere, o nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ ikwu banyere ihe ndị anyị mụtara!—Ọma 145:7; Ọrụ 4:20.
3 Anyị agaghị adabere nanị n’ihe ndị anyị mụtara n’oge ndị gara aga iji mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere n’ebe ozi ya dị sikwuo ike. Anyị ga-anọgiderịrị na-amụtakwu banyere eziokwu ahụ ma na-eme ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ mikwuo emie. Ma ọ́ bụghị ya, ozi anyị na-ejere ya nwere ike iji nke nta nke nta ghọọ nke anyị na-eje iji mezuo iwu. (Mkpu. 2:4) Okwu Chineke na-agba anyị ume ka anyị ‘nọgide na-aba ụba n’ezi ihe ọmụma nke Chineke.’—Kọl. 1:9, 10.
4 Otú Anyị Si Amụ Ihe: N’ihi ya, anyị kwesịrị inyocha otú anyị si amụ ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-amụ isiokwu dịịrị ọmụmụ n’Ụlọ Nche, anyị nwere ike ịkanye ihe n’okpuru azịza ha, zaakwa ajụjụ nke ọma. Ma ajụjụ bụ, ànyị na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha ma chee echiche banyere otú anyị pụrụ isi tinye ha n’ọrụ ná ndụ anyị? Mgbe anyị na-agụ ọgụgụ Bible dịịrị izu, ànyị na-agbalị imekwu nnyocha ma ọ bụrụ na ọnọdụ anyị nyere anyị ohere ime otú ahụ ma tụgharịa uche n’ihe mmụta ndị dị na ya? (Ọma 77:11, 12; Ilu 2:1-5) Lee nnọọ uru ọ bara ichebara Okwu Chineke echiche ma tinye obi anyị dum na ya! (1 Tim. 4:15, 16) Ọmụmụ ihe dị otú ahụ ga-echebe obi anyị ma nye anyị ike ịdị “na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ.”—Taịtọs 2:14.