Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Obiọma
1 Ka otu nwanyị nke kpọburu Ndịàmà Jehova asị na-echeta oge o zutere otu n’ime Ndịàmà Jehova na nke mbụ ya, o kwuru, sị: “Apụghị m icheta ihe anyị kwurịtara banyere ya, ma ihe m na-echeta bụ obiọma o gosiri m, na otú o si bụrụ onye nwere omume enyi na obi umeala. Abịara m nwee nnọọ mmasị n’ebe ọ nọ.” Okwu ndị a na-egosi mkpa ọ dị inwe ezi mmasị n’ebe ndị anyị na-ezi ozi ọma nọ.—Fil. 2:4.
2 Ịhụnanya Nwere Obiọma: Otu ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ bụ site n’ịdị obiọma. (1 Kọr. 13:4) Onye nwere obiọma na-enwe nnọọ mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, na-achọ ụzọ ọ ga-esi emere ha ihe ndị ga-abara ha uru. N’eziokwu, ọrụ nkwusa n’onwe ya bụ ọrụ na-egosi na anyị dị obiọma. Ma, anyị kwesịrị igosi na anyị nwere mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụzọ ndị ọzọ, ọ bụghị nanị site n’ikwusara ha ozi ọma. Ụzọ nile anyị si emeso ndị mmadụ ihe—omume enyi anyị, àgwà ọma anyị, ụzọ anyị si aṅa ntị, ihe ndị anyị na-ekwu na otú anyị si ekwu ha, ọbụna otú anyị si ele ndị ọzọ anya—ga-egosi na anyị hụrụ ha n’anya n’ezie.—Mat. 8:2, 3.
3 Mmasị ịhụnanya kpaliri anyị inwe n’ebe ndị ọzọ nọ ga-akpalikwa anyị inyere ha aka n’ụzọ ndị ọzọ. Mgbe otu nwanna nwoke bụ́ onye ọsụ ụzọ na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, otu agadi nwanyị di ya nwụrụ gwara ya ka o si n’ụlọ ya pụọ ozugbo ọ matara na ọ bụ Onyeàmà. Ọ gwara nwanna a na mgbe ahụ ọ pịrị mgbịrịgba ọnụ ụzọ ya, na ya nọ n’elu obere ubube dị na kichin ya, na-achọ ịgbanwe bọlb ọkụ ya. Nwanna ahụ gwara ya, sị: “Ọ dịghị mma ka nanị gị na-arụ ụdị ọrụ a.” Nwanyị ahụ gwara ya ka ọ bata. Nwanna ahụ gbanweere ya bọlb ahụ ma lawa. Mgbe nwa ya nwoke bịara ileta ya n’oge na-adịchaghị anya nwanna ahụ lasịrị, nwanyị a kọọrọ ya ihe merenụ. Obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu nke na ọ bịara chọwa nwanna a iji kelee ya maka ihe ahụ o mere. Mgbe ọ hụrụ ya, ya na ya kparịtara ụka nke ọma. Nke a mere ka nwoke ahụ kwere ka e duziwere ya ọmụmụ Bible.
4 Site n’ịdị obiọma, anyị na-eṅomi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị mmadụ nọ ma na-achọ ozi Alaeze ahụ mma. Ya mere, ka anyị nọgide “na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke . . . site n’obiọma.”—2 Kọr. 6:4, 6.