Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/05 p. 3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 7/05 p. 3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana m Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi Ị Chọtawo Ya?. September: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe akwụkwọ Amụma Daniel ma ọ bụ broshuọ Nọrọ na Nche. October: A ga-enyefe magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ọnwa ahụ nile. N’ebe e gosiri mmasị, biko webata broshuọ Na-achọ, ma gaghachi iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi.

◼ Malite na September, ndị nlekọta sekit ga-ekwu okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa Ka Bible Na-eduzi Gị?”

◼ Ọgbakọ nile e kenyere ịga Mgbakọ Distrikti Uzuakoli 9 kwesịrị ịrịba ama na a ga-enwe mgbakọ a n’asụsụ Bekee, ọ bụghị n’asụsụ Igbo dị ka e dere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke April 2005.

◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla fọm Literacy Report abụọ. Mgbe unu dejupụtasịrị ha, biko zighachirinụ alaka ụlọ ọrụ otu n’August 1. Tinyenụ nke ọzọ na faịlụ ọgbakọ. Biko rịba ama na ọ bụrụgodị na ndị nkwusa nile nọ n’ọgbakọ unu ma ka e si agụ na ka e si ede ma ọ bụkwanụ na unu enweghị klas ịmụ ịgụ na ide, unu ka kwesịkwara idejupụta fọm abụọ ahụ ma zitere alaka ụlọ ọrụ otu iji hụ na ha nwere ihe ndekọ kasị ọhụrụ.

◼ A na-atụ aro ka a na-ezigara alaka ụlọ ọrụ fọm ndị chọrọ ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile dejupụtara, ọ dịkarịa ala iri ụbọchị atọ tupu ụbọchị ha chọrọ ịmalite eruo. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịtụleghachi fọm ndị ahụ iji jide n’aka na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị dejupụtara ya apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha kwesịrị ịhọrọ otu ụbọchị ma buru ya n’uche. Odeakwụkwọ kwesịrị idetu ụbọchị ahụ na Congregation’s Publisher Record (S-21).

◼ Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ na e nwere Pioneer Appointment Letter (Akwụkwọ Ozi Nhọpụta Maka Ndị Ọsụ Ụzọ) (S-202) maka onye ọsụ ụzọ oge nile ọ bụla nọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na unu enweghị ya, biko detaranụ alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ maka ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya