Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, gụnyere ndị bịara Ememe Ncheta nakwa/ma ọ bụ nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. E kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalite iduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha amụwo akwụkwọ Ihe ọmụma na broshuọ Na-achọ. June: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Gbalịa ịmalite iduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi. July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?−Olee otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana m Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ−Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs.
◼ Biko a na-eme ka unu mara na a gaghịzi na-enwe Teta! n’asụsụ Twi. N’ihi ya, a gaghị eme ihe banyere ọda nile a tụrụ maka Teta! a n’ihi na mbipụta nke April-June 2005 ga-abụ nke ikpeazụ ya a ga-ebipụta.