Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32: Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?. September: Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. October: A ga-enyefe Ụlọ Nche na Teta! n’ọnwa ahụ dum. N’ebe e gosiri mmasị, biko webata broshuọ Na-achọ, ma sochie mmasị ahụ e gosiri n’eburu n’uche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Lekwasị anya n’iji broshuọ ahụ amalite ọmụmụ Bible ebe obibi.
◼ Alaka ụlọ ọrụ dị n’Igieduma enwekwuola nọmba telifon ndị na-esonụ: 0803-4561101, 0803-4561102, 0803-4561103.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa September 1 gasịrị dị ka o kwere mee. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ Dị ka a na-eme kwa afọ, e kwesịrị ịgụkọ akwụkwọ na magazin nile e nwere n’August 31, 2004, ma ọ bụ n’oge dị ya nso, dị ka o kwere mee. Ngụkọ a yiri ọgụgụ onye nlekọta akwụkwọ nke ọgbakọ nhazi dị n’aka na-agụ akwụkwọ ole e nwere kwa ọnwa, e kwesịkwara idebanye ọnụ ọgụgụ ha na fọm Literature Inventory (S-18). E kwesịrị ịjụta ohu/ndị ohu na-elekọta magazin ọnụ ọgụgụ magazin e nwere. Odeakwụkwọ nke ọgbakọ nhazi dị n’aka kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ. Ya na onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ nhazi dị n’aka ga-abịanye aka na fọm ahụ. Ọgbakọ ọ bụla nhazi dị n’aka ga-enweta fọm Literature Inventory (S-18) atọ. Biko zighachirinụ alaka ụlọ ọrụ ibé nke mbụ tupu September 6 agafee. Debenụ otu ibé na faịlụ unu. A pụrụ iji ibé nke atọ mee ihe dị ka ibé akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ.
◼ N’August 26-30, 2004, a ga-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere na Betel dị n’Igieduma. N’ụbọchị ndị ahụ, a ga-emechi ebe a na-anata akwụkwọ.