Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/04 p. 2-3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 6/04 p. 2-3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na June: Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Mgbe i ji broshuọ ahụ eme ihe, lekwasị anya n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32: Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. September: Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.

◼ A gbanwewo nọmba telifon nke alaka ụlọ ọrụ dị n’Igieduma nakwa nke ọfịs dị na Lagos. Nọmba fon ọhụrụ ndị a bụ: (Betel dị n’Igieduma) 01–3204850, 01–3204851, 01–3204852, 01–3204853, 01–3204854, 0805–5502368, 0805–5502369, 0805–5502370, 08055502371. Fax: 01–3204855. Ọfịs dị na Lagos: 01–3205227, 01–3205229, 01–5820604. Fax na fon: 01–2647656. Ọ bụrụ na ị pụghị inweta ụda FAX nke Igieduma ma ọ bụ Lagos, kpọzie nke ọ bụla n’ime nọmba fon Igieduma ma ọ bụ Lagos ma gwa onye na-aza fon ka o mee ka i nweta ụda FAX.

Mgbe ị kpọrọ alaka ụlọ ọrụ anyị na fon, onye na-aza fon ga-aza n’asụsụ Bekee, sị, “Jehovah’s Witnesses, Nigeria branch. May I help you?” (“Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke Nigeria. M̀ pụrụ inyere gị aka?”) Kwuo aha gị ozugbo n’ụzọ doro anya, ebe i si akpọ, na aha onye ma ọ bụ ngalaba ụlọ ọrụ ị chọrọ ka gị na ya kwurịta okwu. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịsị, “Aha m bụ John Mark, esi m Lagos akpọ. Biko, achọrọ m isoro [aha onye ma ọ bụ ngalaba ahụ] kwurịta okwu.” Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ị na-akpọ fon maka ihe ndị dịịrị onwe onye, ị pụrụ ikwu nanị, sị, “Biko achọrọ m iso Nwanna [aha onye ahụ, aha nna ya] kwurịta okwu.” Ọ dịghị mkpa ikelewe onye ahụ na-aza fon, na-ajụ ya aha ya, na-ajụ banyere ezinụlọ ya na otú o mere, ma ọ bụkwanụ na-asị “Heloo” ugboro ugboro, ma ọ bụ na-ajụ ya banyere otú ndị mmadụ n’otu n’otu mere ma ọ bụ otú ezinụlọ Betel mere. Nke a bụ n’ihi na ọ chọghị ime ka ndị ọzọ kpọrọ fon nọrọ na-eche ya. Ọ dị ya mkpa ime ka ndị na-akpọ fon nweta ndị ha na-akpọ ozugbo o kwere mee. Dị ka ihe ncheta, akwụkwọ ozi ọ bụla a na-edetara alaka ụlọ ọrụ banyere ihe ndị metụtara ọgbakọ kwesịrị ịbụ òtù ndị okenye ọgbakọ ga-ahụ maka ya.

◼ Iji hụ na e chebere Ụlọ Nzukọ Alaeze, òtù ndị okenye kwesịrị ikenye nwanna nwoke ji ihe akpọrọ ihe ka ọ na-akpọchi ọnụ ụzọ na windo nile mgbe ọ bụla e mechiri nzukọ. Nke a na-agụnye geeti ọ bụla dị gburugburu ya. Onye e kenyere ime nke a kwesịrị ijide n’aka na a kpọchisịrị ebe nile tupu ọ lawa. Ndị okenye kwesịrị inwe ihe ndekọ dị ọhụrụ nke ndị nkwusa ji ihe akpọrọ ihe bụ́ ndị na-ejide mkpịsị ugodi nke Ụlọ Nzukọ Alaeze.

◼ A ga-edepụta ajụjụ ndị a ga-eji atụle vidio bụ́ Respect Jehovah’s Authority ná mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke September. E nwere vidio a n’asụsụ Bekee nakwa n’Ụdị Asụsụ Ndị Ogbi nke America. A na-echetara ọgbakọ nile ka ha depụta mkpụrụ vidio a ole ha chọrọ n’ọda ọzọ ha ga-atụ.

◼ Kaseti ndị ọhụrụ a na-egere egere e nwere:

Learn From the Great Teacher—On Audiocassette (Ọ́bọ́ nke kaseti 5 dị na ya)—Bekee

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya