Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwukwọm nke Akụkọ Bible ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: Akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1988 nke ọgbakọ pụrụ inwe. Ọ bụrụ na unu enweghị nke ọ bụla n’ime ndị a, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere akwụkwọ ndị ahụ meworo ochie karị, ndị unu pụrụ iji mee ihe. Ọgbakọ ndị na-enweghị akwụkwọ ndị meworo ochie karị pụrụ inyefe Mankind’s Search for God. February: Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na unu enweghị akwụkwọ a, unu pụrụ iji Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! mee ihe n’ọnọdụ ya. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ e nweelarị akwụkwọ a, a pụrụ inyefe Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
◼ Dị ka ihe ncheta nye ụmụnna na-ahụ maka ihe ndekọ ego ọgbakọ, e kwesịrị ịdị na-akwụnye onyinye ndị e tinyere n’igbe ndị e ji eme ihe maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ na Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze kwa ọnwa, e kwesịghịkwa iji ya kwụọ ego a gbazitere maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ mmefu ndị ọzọ ọgbakọ mere.
◼ Malite na March 15, 2004, ruo May 16, 2005, a ga-atụle akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.