Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na December 29, 2003. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu November 3 ruo December 29, 2003. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. N’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ mkpa iji Bible na-eme ihe n’ozi ubi? [be-IB p. 145 para. 2, igbe]
2. Olee otú ihe ndị e kwuru gburugburu akụkụ Akwụkwọ Nsọ si emetụta ụzọ e si ewebata ya? [be-IB p. 148-149]
3. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa imesi okwu ndị kwesịrị ekwesị ike mgbe ị na-agụ otu akụkụ Bible, oleekwa otú a pụrụ isi mezuo nke a? [be-IB p. 151 para. 2, igbe]
4. Olee otú anyị si eji ndụmọdụ Pọl bụ́ “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi” eme ihe mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, gịnịkwa mere nke a ji dị oké mkpa? (2 Tim. 2:15) [be-IB p. 153 para. 2, igbe]
5. Olee otú Pọl si “tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ”? (Ọrụ 17:2, 3) [be-IB p. 155 para. 5–p. 156 para. 1]
IHE OMUME NKE 1
6. Mgbe anyị ji ihe bụ́ isi anyị ji eme nnyocha, ya bụ́ Bible, akwadebe ihe omume, gịnị mere o ji bụrụ ihe bara uru (1) inyocha ihe ndị e kwuru gburugburu amaokwu dị iche iche, (2) ile ntụaka etiti peeji, na (3) iji ndepụta nke okwu ndị dị na Bible mee nnyocha? [be-IB p. 34 para. 3–p. 35 para. 2]
7. Olee otú e si egosipụta ezi iguzosi ike n’ihe, oleekwa onye a na-egosi ya? [w01-IB 10/1 p. 22-23]
8. Gịnị ka okwu ahụ pụtara, nke bụ́ “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha”? (Jen. 1:27) [w01-IB 12/1 p. 4 para. 2]
9. Olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-ekpebi isi ihe ndị anyị ga-eji mee ihe mgbe anyị mesịrị nnyocha maka isiokwu anyị ga-ekwu okwu na ya? [be-IB p. 38]
10. N’ihi gịnị ka okwu Jizọs banyere “ụbọchị Noa” ji kwekọọ n’ọnọdụ anyị nọ na ya taa? (Mat. 24:37) [w01-IB 11/15 p. 31 para. 3-4]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Olee otú akwụkwọ ozi Pọl degaara Faịlimọn si egosi na ọrụ Onye Kraịst bụ inyere ndị mmadụ aka ịghọ Ndị Kraịst, ọ bụghị ịkwalite mgbanwe n’etiti ọha na eze? (Faị. 12)
12. Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti ‘mkpafu,’ “iwezụga onwe,” na ‘ndapụ’? (Hib. 2:1; 3:12; 6:6) [w99-IB 7/15 p. 19 para. 12; w86-IB 12/1 p. 14 para. 16-17; w80-E 12/1 p. 23 para. 8]
13. Olee otú anyị pụrụ isi zere iji okwu ahụ bụ́ “ọ bụrụ uche Jehova” na-eme ihe egwuregwu? (Jes. 4:15) [lee cj-E p. 171 para. 1-2]
14. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘ichere na iburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche,’ oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? (2 Pita 3:12) [w97-IB 9/1 p. 19-20]
15. Olee ndụmọdụ dị mkpa a na-enye Ndị Kraịst taa bụ́ nke a na-ahụ n’ozi ndị e zigaara ọgbakọ asaa ndị ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe isi nke 2 na nke 3? (Mkpu. 2:4, 5, 10, 14, 20; 3:3, 10, 11, 17, 19)