Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke September 2 ruo December 23, 2002. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ajụjụ ole i nwere ike ịza n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha nke gị. Nọmba peeji na paragraf nwere ike ghara ịpụta n’aka nile e zoro n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ịtụgharị uche n’àgwà ndị magburu onwe ha nke Jehova bụ nzọụkwụ dị mkpa n’ịbịaru ya nso. (Ọma 143:5) [w00 10/15 p. 4 para. 6]
2. Njikọta nke osisi abụọ ndị ahụ e kwuru banyere ya n’Ezikiel 37:15-24 nwere ihe ya na ya yiri taa n’ihi na na 1919, e mere ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ dị n’otu n’okpuru Kraịst, bụ́ “otu Eze” na “otu Onye ọzụzụ atụrụ” ha. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 9/15 p. 25 para. 13.]
3. Ọ bụ ezie na ndị nkatọ Bible enwewo obi abụọ banyere ọbụbụ akwụkwọ Daniel bụ akụkọ ihe mere eme, ihe mgbe ochie ndị e gwupụtara n’ala eri ọtụtụ afọ etipịawo ihe ahụ ha na-azọrọ kpam kpam. [w00 5/15 p. 12 para. 12]
4. Mgbe ihe anyị nụrụ sitere n’ọnụ onye yiri ka ọ̀ bụ onye maara nke a na-akọ ma ọ bụ n’ọnụ onye na-azọrọ na o nwere amamihe dị ukwuu, a pụghị inwe ezi ihe mere a ga-eji jụ ya dị ka ụgha. [w00 12/1 p. 29 para. 7-8]
5. Jehova adịghị egosi ndị mehiere n’ụzọ dị oké njọ megide ya ebere. [w89 3/1 p. 15 para. 5-6]
6. Mgbe Chineke kpọrọ Emọz ka o jeere ọha mmadụ ozi, ọ bụ onye na-azụ atụrụ, nakwa onye na-arụ ọrụ dị ala nke nwere oge e ji arụ ya bụ́ idozi mkpụrụ osisi fig. (Emọs 7:14, 15) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee si-E p. 148 para. 1]
7. Obadaịa 16 na-ebu amụma na a ga-ekpochapụ mba Edọm n’ihi asị ha kpọrọ Juda. (Obad. 12) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 4/15 p. 30 igbe.]
8. “Asụsụ dị ọcha” e kwuru banyere ya na Zefanaịa 3:9 na-agụnye nghọta kwesịrị ekwesị nke eziokwu banyere Chineke na nzube ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w01 2/15 p. 27 para. 18.]
9. Ihe mere Jizọs ji nwee nrụgide mmetụta uche siri ike nke ukwuu n’ogige Getsemeni bụ na o nwere nchegbu banyere otú ọnwụ ya dị ka omempụ a na-asọ oyi ga-esi emetụta Jehova na aha nsọ Ya. (Mat. 26:38; Luk 22:44) [w00 11/15 p. 23 para. 1]
10. “Onye Filistia” ahụ nke ‘dị ka otu sheik na Juda,’ dị ka a kọwara ya na Zekaraịa 9:6, 7, na-akọwa ndị òtù nke atụrụ ọzọ ahụ taa n’ụzọ amụma, bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye ọzụzụ ma nye ikike dị ka ọ dị mkpa. (Mat. 24:45) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 7/1 p. 23 para. 14.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ iji ibu ọrụ anyị nke ikwusa ozi ọma tụnyere ibu ọrụ Izikiel dị ka onye nche? (Ezik. 33:1-11) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 1/1 p. 28 para. 13.]
12. Olee ihe a hụrụ n’oge a bụ́ nke ya na ọhụụ Izikiel banyere ọkpụkpụ ndị ahụ kpọrọ nkụ yiri? (Ezik. 37:5-10) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 9/15 p. 24 para. 12.]
13. N’ihi gịnị ka Jehova ji kpọlite onye amụma bụ́ Zekaraịa? [w89 6/15 p. 30 para. 1]
14. Gịnị ka obodo ahụ a hụrụ n’ọhụụ Izikiel na-anọchite anya ya? (Ezik. 48:15-17) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99 3/1 p. 18 para. 22.]
15. Olee ókè ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ na-aghaghị idebe? [fy p. 106 para. 11]
16. Gịnị ka a pụrụ ịmụta site ná mmeghachi omume Daniel nye iwu eze nke bụ́ na a gaghị ekpegara chi ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ekpere ruo ụbọchị 30 ma e wezụga eze? (Dan. 6:7-10) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee dp p. 125 para. 25-28.]
17. N’ịkpọsa ozi dị aṅaa nke Jehova, ka ihe fọdụrụ ahụ dịworo ka ọdụm n’etiti mba nile? (Maị. 5:8) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w82 1/15 p. 20 para. 10.]
18. Gịnị ka e bu n’uche kwuo okwu bụ́ “i jiwo mkpanaka ya dụpuo ndị agha ya isi,” nke dị na Habakuk 3:14? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w00 2/1 p. 22 para. 15; w82 2/1 p. 29 para. 5-6.]
19. Gịnị ka a na-egosi site n’ojiji e ji okwu ahụ bụ́ “eleghị anya” mee ihe na Zefanaịa 2:3? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w01 2/15 p. 19 para. 8.]
20. N’ikwekọ na Zekaraịa 8:6, n’afọ ndị gafeworonụ eri 1919, olee otú Jehova siworo mezuo ihe pụrụ iyiworị ihe sibigara ike ókè n’otú mmadụ si ele ihe anya? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 1/1 p. 16 para. 18-19.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Anyị na-agwa Jehova okwu site __________________________, nke bụ́ okwu ofufe a na-agwa Chineke; n’aka nke ya, ụzọ bụ́ isi o si agwa anyị okwu bụ site __________________________. (Ọma 65:2; 2 Tim. 3:16) [w00 10/15 p. 5 para. 2-3]
22. Mgbe ndị dere Bible zoro aka n’ebe Ndị Kraịst nọ dị ka ndị ohu Chineke, ha adịghị ezo aka n’ajọ __________________________ dabeere ná mmanye; ihe e bu n’uche bụ ido onwe onye n’okpuru nke sitere __________________________, na-adabere n’ịhụnanya miri emi, nke si n’obi, maka Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Mat. 22:37; 2 Kọr. 5:14) [w00 11/15 p. 21 para. 6]
23. ‘Mpụta nke okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jeruselem’ weere ọnọdụ na __________________________, na-aka akara mmalite nke izu 69 nke afọ, bụ́ nke gwụsịrị mgbe Mezaịa bịara na __________________________. (Dan. 9:25) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee dp p. 190 para. 20–p. 191 para. 22.]
24. Ịdị nso nke __________________________ nke Jehova kwesịrị ịkpali anyị __________________________ na __________________________. [w89 3/15 p. 31 para. 5]
25. N’okwu ikpe nke e kwuru megide isi obodo Asiria, bụ́ __________________________ na-egosi na a ga-emezu ịbọ ọ́bọ̀ Chineke n’ahụ́ ndị iro, bụ́ ndị na-adịghị enye Ya ụdị ofufe ahụ. [w89 5/15 p. 24 para. 3]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị a na-esonụ:
26. Na (1914; 1919; 1935) Jehova weliteere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ “otu onye ọzụzụ atụrụ,” bụ́ Jizọs Kraịst. [w88 9/15 p. 24 para. 8]
27. Otu akụkụ bụ́ isi nke akwụkwọ (Aịsaịa; Ezikiel; Daniel) bụ amụma ndị metụtara mpụta nke ike ọchịchị ụwa dị iche iche na ihe ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị ha mere. [w00 5/15 p. 12 para. 13]
28. N’ikwekọ na Daniel 2:34, 35, 45, nkume ahụ nke kụrụ ma tipịa ihe oyiyi ahụ na-anọchi anya (Amagedọn; ozi ikpe ọmụma na-agba agba ná ntị nke ndị Chineke kpọsara; Alaeze Mezaịa ahụ). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 4/15 p. 17 para. 10; si-E p. 142 para. 20, 23.]
29. Mba nke igurube ihe atụ ahụ a kpọtụrụ aha na Joel 1:4-6 na-anọchite anya (mba Izrel; Ndị Kraịst e tere mmanụ; usuu ndị agha Rom). (Ọrụ 2:1, 14-17) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 5/1 p. 9 para. 9.]
30. Ndị Kraịst nwere echiche ziri ezi adịghị ajụ iji ọgwụ agwọ ọrịa ma ọ bụrụhaala na (ọ ga-eme ka onye na-arịa ọrịa nwere onwe ya; o megideghị iwu Chineke; o megideghị echiche ndị ọkachamara). [fy p. 124 para. 19]
Jikọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Hos. 6:6; Joel 2:32; Zek. 4:6, 7; 13:3; Rom 12:2
31. Anyị agaghị ekwe ka ụkpụrụ nke ihe ndị a na-emekebe n’ebe anyị bi na nke ọrụ ego nke usoro ihe a kpụgharịa echiche anyị. [w00 11/1 p. 21 para. 5]
32. Ihe na-eme Chineke obi ụtọ abụghị ọtụtụ àjà ndị a chụrụ iji mezuo iwu, kama ọ bụ ezi ịhụnanya nke dabeere n’ịmara ya. [Ọgugụ Bible kwa izu; lee si-E p. 145 para. 16.]
33. Ịmara onye nwe aha ahụ bụ́ Jehova, ịsọpụrụ ya, na ịdabere n’ebe ọ nọ, dị oké mkpa maka nzọpụta. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 3/15 p. 30 igbe.]
34. A na-emezu nzube Chineke, ọ bụghị n’ihi ikike mmadụ ọ bụla, kama ọ bụ site na mmụọ ya, bụ́ nke na-eme ka ndị ohu ya nwee ike imeri ihe mgbochi ndị buru ibu na ịtachi obi n’ijere Chineke ozi. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee si-E p. 169 para. 2]
35. Iguzosi ike n’ihe e ji mara nzukọ Jehova karịrị mmekọrịta ọ bụla nke mmadụ, dị ka nke ụmụnne. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee si-E p. 171 para. 24]