Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche July 15
“Ì chere na a na-ata ndị ajọ omume ahụhụ na hel? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-egosi n’ụzọ doro anya ihe bụ́ ntaramahụhụ maka mmehie. [Gụọ Ndị Rom 6:23a.] Mgbe ahụ, hel ọ̀ bụ ebe mmekpa ahụ́ nke na-ere ọkụ? Ọ̀ bụ nanị ọnọdụ nke ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ? Magazin a na-enye azịza sitere n’Akwụkwọ Nsọ nye ajụjụ ndị a.”
Ụlọ Nche Aug. 1
“Ọtụtụ ndị na-eche na echiche na omenala ndị dabeere na nkwenkwe ụgha bụ nanị ihe e ji egwuri egwu. [Gosi otu ihe ma ọ bụ abụọ site n’igbe dị na peeji nke 5.] Ị̀ chetụwo echiche banyere ihe kpalitere echiche ndị dị otú ahụ? [Mgbe a zaghachisịrị, gụọ 2 Ndị Kọrint 11:14.] Magazin nke a na-ekwu ihe bụ́ echiche Bible banyere nkwenkwe ụgha.”
Teta! Aug. 8
“Ọtụtụ ndị na-ele ịgba chaa chaa anya dị ka ihe ọha na eze nakweere nke e ji egbu oge. Ndị ọzọ na-eche na n’ọnọdụ ka ukwuu, ọ na-enwe mmetụta ọjọọ n’ezinụlọ na n’ọha na eze. Mbipụta Teta! nke a na-enyocha ịgba chaa chaa na-adabere ná nchọpụta ndị e mere bụ́ ndị e bipụtara na nso nso a. Ị pụkwara inwe mmasị ịgụ otú ụkpụrụ Bible si emetụta okwu a.” Dị ka ihe atụ, gụọ 1 Timoti 6:10.
“Ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha banyere mmụba nke ime ihe ike na iyi ọha egwu. Ikekwe, i kwenyere n’ihe Eklisiastis 8:9 kwuru. [Gụọ ya ma nye ohere maka nzaghachi.] Mbipụta Teta! nke a na-ekwu banyere ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndị mere n’oge gara aga, ọ na-egosikwa otú ụdị nchịkwa ahụ ga-esi akwụsị n’isi nso.”