Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke May 7 ruo August 20, 2001. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike ịza n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe gị. Nọmba peeji na paragraf nwere ike ghara ịpụta n’aka nile e zoro n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ekpere ahụ e zoro aka na ya na Nehemaịa 2:4 bụ ekpere enweghị olileanya, nke e kpere mgbe oge garala. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 6/1 p. 21 para. 8.]
2. E si n’okwu Grik bụ́ ek·kle·siʹa sụgharịa okwu bụ́ “ọgbakọ,” bụ́ okwu nke na-enye echiche nke ịdị n’otu na nkwadorịta. [w99 5/15 p. 25 para. 4]
3. Ọbụbụ Pọl onyeozi bụ nwa amaala Rom mere ka o nwee ike ịgọpụrụ ozi ya n’ụzọ iwu kwadoro ma were ozi ọma ahụ gaa n’ihu onye ọchịchị kasị elu n’Alaeze Ukwu Rom. (Ọrụ 16:37-40; 25:11, 12) [w99 5/15 p. 31 para. 2]
4. N’oge Job dịrị ndụ, ọ bụ nanị ya bụ mmadu nke kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova. (Job 1:8) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 8/1 p. 31 para. 3-4.]
5. Eziokwu ahụ bụ́ na Sọl, ma ọ bụ Pọl, kwadoro onwe ya site n’ịkpa ákwà ụlọikwuu na-egosi na o si n’ezinụlọ dara ogbenye. (Ọrụ 18:2, 3) [w99 5/15 p. 30 para. 2–p. 31 para. 1]
6. N’agbanyeghị na Devid mere ajọ mmehie, Jehova pụrụ ikwu na o “weere obi ya nile jesoo m” n’ihi omume nchegharị na ezi àgwà Devid. (1 Eze 14:8) [w99 6/15 p. 11 para. 4]
7. Ọ gwụla ma Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ihe anyị kwere ná nkwa, anyị kwesịrị ime ihe nile anyị nwere ike ime iji mezuo ihe anyị kwere ná nkwa ọbụna ma a sị na anyị emesịa chọpụta na ime otú ahụ siri ike. (Ọma 15:4) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 9/15 p. 28 para. 5.]
8. Abụ Ọma 22:1 na-egosi na okwukwe Devid funahụrụ ya ruo nwa oge mgbe o nwere nrụgide. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 8/15 p. 26 para. 19.]
9. Esta gosipụtara abamuru nke obi umeala n’ịghara ịrịọ ọla ma ọ bụ ezi ákwà tupu ọ pụta n’ihu eze. O kwere ka mmadụ ime nke obi ya, ya na “mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo,” nweta ihu ọma eze. (Esta 2:15; 1 Pita 3:1-5) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 7/1 p. 27 para. 10.]
10. Ọbụna ma a sị na ihe na-agara ndị ajọ mmadụ nke ọma, anyị ekwesịghị ikwoso ha ekworo na ịgbalị ịdị ka ha. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ‘ịnọ duu n’ihu Jehova,’ ọ bụghị ịchọpụta mmejọ, kama, jiri ịnọ nwayọọ na-atụkwasị ya obi maka imere anyị ihe n’oge nke aka ya. (Ọma 37:5, 7) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 8/15 p. 27 para. 16.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Olee otú Ezra na ndị na-enyere ya aka si ‘mee ka a ghọta’ Iwu ahụ? (Neh. 8:8) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 6/1 p. 22 para. 4.]
12. Olee ụzọ e si enweta “ọṅụ Jehova”? (Neh. 8:10) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 6/1 p. 22 para. 9.]
13. Gịnị mere e ji gọzie ndị ahụ “weere afọ ofufo nye onwe ha ibi na Jerusalem”? (Neh. 11:2) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 6/1 p. 22 para. 12.]
14. Gịnị mere Esta ji nọọ ọdụ n’ịgwa eze ihe bụ́ nzube ya kpọmkwem? (Esta 5:6-8) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 7/1 p. 27 para. 18.]
15. N’oge Job, olee otu oké ihe iseokwu Setan kpalitere? (Job 1:6–2:8) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 11/15 p. 11 para. 5.]
16. N’ihi gịnị ka ndụmọdụ Elifaz ji kụdaa Job obi ma ghara ịgba ya ume? (Job 21:34; 22:2, 3) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 2/15 p. 27 para. 5-6.]
17. Gịnị bụ Abụ Ọma? [w86 8/15 p. 26 para. 1]
18. Banyere “ihe efu” dị aṅaa ka mba nile nọgidere ‘na-atụgharị uche,’ dị ka e dekọrọ ya n’Abụ Ọma 2:1? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 8/15 p. 26 para. 5.]
19. Ihe dị aṅaa dị irè banyere eleghị mmadụ anya n’ihu ka anyị pụrụ ịmụta site n’ozi Filip nke metụtara ndị Sameria na onye ọrụ ọchịchị Etiopia ahụ? (Ọrụ 8:6-13, 26-39) [w99 7/15 p. 25 para. 2]
20. Olee otú Job si gosipụta nkwenye o kwenyere na Chineke pụrụ ịkpọlite ya site n’ili, bụ́ ebe o lere anya dị ka ebe nzopụ pụọ ná nsogbu ya nile? (Job 14:7, 13-15) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w00 5/15 p. 27 para. 7–p. 28 para. 1.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Esta 8:17 na-ekwu na ndị mmadụ nọ ‘na-ekwupụta na ha bụ ndị Juu’; n’otu aka ahụkwa taa, “ __________________________” nke “atụrụ ọzọ” ahụ esonyeworo __________________________. (Mkpu. 7:9; Jọn 10:16; Zek. 8:23) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 7/1 p. 28 para. 14.]
22. Dị ka Ọrụ 1:7 na-egosi, ọ bụ ezie na Jehova na-eji nnọọ __________________________ akpọrọ ihe, ụbọchị ime mpịazi ya ga-abịa dị ka __________________________, mgbe ụmụ mmadụ na-adịghị atụ anya ya. (2 Pita 3:10) [w99 6/1 p. 5 para. 2-3]
23. Jehova __________________________ ndị ya raara onwe ha nye __________________________ na-agba àmà, a sịgodị na ule dị iche iche emee ka ha ghọọ __________________________ dị ka ndị nwụrụ anwụ. (Job 26:5) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 11/15 p. 15 para. 1.]
24. Obi ike, ntụkwasị obi, na inwerịta nghọta na-eme ka inwe nkwurịta okwu dị mma kwe omume, a na-enwekwa àgwà ndị a mgbe e lere alụmdi na nwunye anya dị ka mmekọrịta __________________________, mgbe e nwekwara ezi __________________________ ime ka ọ gaa nke ọma. [w99 7/15 p. 21 para. 3]
25. Nrụgide ndị ọgbọ nke dị mma pụrụ inyere anyị aka __________________________ ihe ndị a chọrọ n’ụzọ omume na n’ụzọ ime mmụọ __________________________ ma si otú ahụ nyere anyị aka __________________________ na-ejere Jehova ozi. [w99 8/1 p. 24 para. 4]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Nnọdụ Mọdekaị “na-anọdụ n’ọnụ ụzọ ámá eze” na-egosi na (ọ bụ onye nche eze; ọ bụ otu n’ime ndị ọrụ nke eze Ahasuerọs; ọ na-echere iji gwa eze okwu). (Esta 2:19, 20) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 7/1 p. 27 para. 9.]
27. Dị ka e dekọrọ ya na Job 19:25-27, Job kwupụtara okwukwe na ọ ‘ga-ahụ Chineke’ n’ihi na (a ga-emere ya amara site n’ime ka ọ hụ ọhụụ; a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie gaa eluigwe; a ga-emeghe anya nghọta ya ịhụ ihe bụ́ eziokwu banyere Jehova). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 11/15 p. 19 para. 17.]
28. Job bụ onye kwesịrị nṅomi n’ihe banyere (okwukwe; obiọma; ntachi obi). (Job 42:10-17; Jes. 5:11) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 11/15 p. 23-24 para. 13-14.]
29. E kewara akwụkwọ Abụ Ọma ụzọ (atọ; isii; ise). [w86 8/15 p. 26 para. 2]
30. Ọ chọrọ (ntachi obi; ịhụnanya; okwukwe) iji nwee ike chere Chineke ka o mee ihe n’ihi anyị. [w86 10/15 p. 27 para. 16]
Jikọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Neh. 3:5; Ọma 12:2; 19:7; 37:23, 24; 2 Pita 3:15
31. Anyị kwesịrị ịdị njikere iji ike anyị rụọ ọrụ n’ejighị mpako na-ajụ ya, n’eleghị ọrụ siri ike anya dị ka ihe na-ekwesịghịrị anyị. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 6/1 p. 21 para. 12, 19.]
32. Onye Kraịst pụrụ ‘ịda’ n’ihe banyere nkụda nke obi, nkụda aka na agazighị nke ọma nke ikpe ikpe ma ọ bụ nke ego, ma site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke na ndị na-efe Ya ofufe na-ahụ n’anya, “a gaghị atụdasị ya” kpam kpam n’ihe banyere ihe ime mmụọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87 6/15 p. 30 para. 14.]
33. Ndidi Chineke emewo ka o kwe anyị omume ịbịa mara nzube ya na ime mgbanwe ná ndụ anyị iji nweta ngọzi ndị o kwere ná nkwa. [w99 6/1 p. 5 para. 3]
34. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ enyi Chineke, anyị aghaghị ịbụ ndị nwere obi eziokwu, n’enweghị ihu abụọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 9/15 p. 26 para. 7.]
35. Irube isi n’iwu Chineke na-eweghachi mkpụrụ obi mmadụ, na-akwalitekwa ọdịmma mmadụ. [Ọgụg̣ụ Bible kwa izu; lee w00 10/1 p. 13 para. 4.]