Akụkọ Ozi August
Av. Av. Av. Av.
Ọnụ Ọgụgụ: Hrs. Mags. R.V. Bi.St.
Sp’l Pios. 407 139.0 13.0 66.0 11.0
Pios. 19,554 68.0 6.0 25.0 6.0
Aux. Pios. 6,605 57.0 4.0 16.0 4.0
Pubs. 176,554 11.0 1.0 4.0 1.0
NGỤKỌTA 203,110 Ndị E Mere Baptism: 813
Anyị nwere obi ụtọ ịkọ na akụkọ ozi anyị nke August ewetawo afọ ije ozi 1997 ná ngwụsị na-enye nnukwu obi ụtọ, na-enwe ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ 203,110 ndị nkwusa. Ndị ọsụ ụzọ oge nile dị 19,554 nyere akụkọ ozi bụkwa ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu. Anyị nwere ugbu a ọgbakọ 3,944 e debara aha ha n’akwụkwọ.
Otu akụkụ na-agba nnọọ ume nke akụkọ afọ ije ozi 1997 bụ na na mbụ ya kemgbe akụkọ ọrụ Alaeze ahụ na Nigeria, anyị nwere 17,304 ndị e mere baptism n’otu afọ ije ozi. Ọzọkwa, ndị bịara Ememe Ncheta maka 1997 dị 598,717. Nke a na-egosi ịrị elu 15 pasent karịa nke ndị bịara ya na 1996 nke bụ 520,413. Anyị na-ekele Jehova maka ịgọzi ọrụ anyị nke ukwuu n’afọ a. Anyị ga-agba mmadụ nile ume ilebakwuru itinye akwụkwọ anya, karịsịa itinye ụtụ magazin, n’ihi na e nwere mbelata 2.9 pasent n’afọ ije ozi gara aga.