Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/95 p. 7-8
  • Ịkwadebe Maka Nletaghachi Ndị Dị Irè

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkwadebe Maka Nletaghachi Ndị Dị Irè
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 12/95 p. 7-8

Ịkwadebe Maka Nletaghachi Ndị Dị Irè

1 Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Mat. 28:19, 20) A na-arụzu izi ndị na-eso ụzọ ọhụrụ ihe site n’ime nletaghachi na iduzi ọmụmụ Bible. Ndị ahụ gosiri mmasị n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu mgbe mbụ ị gara na nke ha yiri nnọọ ka ha ga-enwe obi ụtọ ịnabata gị ọzọ. Ọ bụrụ na i mee atụmatụ tupu oge eruo, kwadebe nke ọma, dokwaakwa ime nletaghachi ndị dị irè, ị pụrụ inwe ike ịmalite ma duzie ọmụmụ Bible ebe obibi ndị a na-enwechi anya.

2 Ọ bụrụ na unu tụlere paragraf nke 2 na 3 nke okwu mmalite nke akwụkwọ “Nwoke Kasị Ukwuu,” ị pụrụ ịsị:

◼ “Na mgbe ikpeazụ m bịara ebe a, anyị tụlere isi ihe bụ na Jisọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ndị eze ukwu na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekwenyewo n’otu aka ahụ na Jisọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ma gịnị mere ya nwoke kasị ukwuu? [Nye ohere maka nzaghachi.] Jisọs mere ihe nile dị nnọọ ka Nna ya, Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, gaara emewo ha. [Gụọ Jọn 14:9, 10.] Nṅomi o ṅomiri Chineke n’ụzọ zuru okè mere ya nwoke kasị ukwuu. Ma àgwà Chineke ndị dị aṅaa ka Kraịst gosipụtara?” Sapeta okwu mmalite ahụ ma tụlee isi ihe ụfọdụ site n’isiokwu nta bụ́ “Ihe Mere O Ji Bụrụ Onye Kasị Ukwuu.” Mee ndokwa maka ọbịbịa gị ọzọ.

3 Ọ bụrụ na ị laghachi iji gaa n’ihu ná mkparịta ụka n’ịchịisi Jisọs Kraịst, ị pụrụ ịsị:

◼ “Anyị kwekọrịtara ná mkparịta ụka anyị gara aga na a họpụtawo Jisọs Kraịst ịchị ụwa. Ma n’ihi gịnị ka Jisọs ga-eji bụrụ onye ọchịchị kasị mma ụwa pụrụ inwe mgbe ọ bụla? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ kpọrọ ikpe na-ezighị ezi asị, ọ hụkwara ihe ọma n’anya. [Gụọ Ndị Hibru 1:9.] Mgbe ọ nọ n’elu ụwa o gosiri n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta ihe ọ ga-arụzu dị ka Eze n’elu ụwa. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ na-agụ ihe oriri, ọbụnakwa mee ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. E wezụgakwa nke ahụ, o nwekwara ike karịrị nke mmadụ efu ịchịkwa ọdachi. È nwere onye ọchịchị ọbụla nke pụrụ inwe ike hà ka nke ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Anyị pụrụ ịmụtakwu banyere onye ọchịchị a karịrị mmadụ n’isi nke 53.” Mgbe ahụ, tụlee paragraf ụfọdụ ma kwee nkwa ịbịaghachi.

4 Ị pụrụ isi otú a malite mkparịta ụka gị na onye nwere ọchịchọ maka mmekọrịta chiri anya n’ebe Jisọs nọ:

◼ “Na mgbe ikpeazụ m bịara, anyị gụrụ Jọn 17:3. Anyị ghọtara mkpa ọ dị inwe ezi ihe ọmụma iji nwee mmekọrịta chiri anya n’ebe Jisọs Kraịst na Nna ya nke eluigwe nọ. Dị ka ihe atụ, ị̀ matara ihe mere Jisọs jiri site n’eluigwe bịa? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọtụtụ ga-asị na ọ bịara ịgbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ. Ọ bụ eziokwu! Otú ọ dị, e nwere ihe ọzọ dị mkpa mere Jisọs jiri bịa n’ụwa. [Gụọ Luk 4:42, 43.] N’ụzọ bụ isi ọ bịara iji kwusaa ma kụziere ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke.” Tụlee isi ihe ụfọdụ banyere Alaeze ahụ site n’isi nke 133. Ọ bụrụ na o kwere mee, malite ọmụmụ Bible.

5 Ọ bụrụ na ị na-alaghachi na nke onye i jiri ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem malitere ọmụmụ Bible, ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka gị n’ụzọ dị otú a:

◼ “Na mgbe ikpeazụ m bịara na nke gị, anyị kparịtara ụka site n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, isi nke 59, ‘Ònye n’Ezie Ka Jisọs Bụ?’ Ị ga-echeta na ọ bụ Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ nke a. Abịara m ugbu a isoro gị tụlee akụkụ ikpeazụ nke isiokwu ahụ. Ọ na-ekpughe ihe ndị ọzọ banyere onye Jisọs bụ n’ezie.” Ị pụrụ ijiri mkparịta ụka gị na onye nwe ụlọ gaa n’ihu.

6 Otu onye tiri mkpu mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ a, sị: “Ọ bụ akwụkwọ kasị mma m gụtụworo! Ọ gbanwere ndụ m.” Nletaghachi ndị dị irè na nke ndị gosiworo mmasị n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu pụrụ ịrụpụta ihe ọma dị iche iche n’ókèala gị.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya