Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 29, 2018 RUO NỌVEMBA 4, 2018
3 ‘Unu Maara Ihe Ndị A, Unu Ga-enwe Obi Ụtọ ma Unu Na-eme Ha’
Mmadụ inwe amamihe abachaghị uru ma ọ bụrụ na o nweghị ihe o ji ya mee. Ma, ka anyị nwee ike ime ihe anyị mụtara, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi. Isiokwu a ga-agba anyị ume ka anyị na-adị umeala n’obi. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-eṅomi ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị ziri ụdị mmadụ niile ozi ọma, tinye ndị ọzọ n’ekpere ha, ma chere ka Jehova mee ihe maka ya.
8 Ndị Kraịst Merala Agadi, Jehova Ji Ozi Unu Na-ejere Ya Kpọrọ Ihe
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 5 RUO 11, 2018
12 Na-ahụ Ndị Ọzọ n’Anya n’Ihi na Ọ Na-ewuli Ha Elu
N’oge a tara ezigbo akpụ, ọ dị mfe mmadụ ịda mbà n’obi. Jehova na Jizọs na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Ma, anyị kwesịkwara ịna-akasirịta ibe anyị obi ma na-agba ibe anyị ume. Isiokwu a na-egosi otú anyị nwere ike isi na-ewuli ibe anyị elu n’ịhụnanya.
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 12 RUO 18, 2018
17 Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-efe “Chineke Bụ́ Onye Obi Ụtọ”
Jehova bụ Chineke onye obi ụtọ. Ọ chọkwara ka ndị ohu ya na-enwe obi ụtọ. Ma, olee otú anyị nwere ike isi na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ọnwụnwa na nsogbu ndị na-abịara anyị n’ụwa Setan a? N’ihe Jizọs kụziri n’Ozizi Elu Ugwu ya, ọ gwara anyị ihe anyị ga-eme ka anyị nọgide na-enwe obi ụtọ.
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 19 RUO 25, 2018
23 Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 26, 2018 RUO DISEMBA 2, 2018
28 Dịrị Obiọma ma Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche Ka Jehova
N’ụwa a ndị mmadụ na-eche naanị banyere onwe ha, ndị ohu Jehova dị iche n’ihi na ha hụrụ ndị mmadụ n’anya. Otu ụzọ ha si egosi ya bụ ịna-echebara ndị ọzọ echiche. N’isiokwu abụọ a, anyị ga-atụle otú Jehova si na-echebara anyị niile echiche nakwa otú anyị ga-esi na-eṅomi ya.