Nke A Na-amụ Amụ
EPREL 2016
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ MALITE: MEE 30 RUO JUN 26, 2016
© 2016 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A:
KOLOMBIA
Ụmụnna nọ́ n’obodo a na-eme ike ha niile iji na-ezi ndị Wayuu ozi ọma. Ndị Wayuu na-enwe mmasị ikwu banyere Chineke. Ha na-agakarị n’obodo mepere emepe ere ọmarịcha ihe ndị ha na-arụpụta. Ha gaa, ụmụnna ndị na-ekwusa ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo na-ezi ha ozi ọma
NDỊ NKWUSA OLE NỌ́ NA YA
166,049
MMADỤ OLE A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL
229,723
NDỊ BỊARA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS (2015)
510,952
A naghị ere akwụkwọ a ere. O so n’ihe e ji arụ ọrụ ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ụwa dum. E jikwa onyinye sí ndị mmadụ n’obi akwado ọrụ a.
Ị chọọ inye onyinye, biko gaa na www.jw.org/ig.
Ọ gwụkwala ma è dere aha Baịbụl ọzọ, amaokwu Baịbụl ndị e dere n’akwụkwọ a si na Baịbụl e ji asụsụ Igbo a na-ede n’oge a dee, ya bụ, Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ.