Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 2/15 p. 29
  • “Ụmụaka Kwesịrị Ịma Chineke”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ụmụaka Kwesịrị Ịma Chineke”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Enyemaka Iji Ghọta Bible
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ihe Dị Ụmụaka Mkpa Inweta n’Aka Ndị Mụrụ Ha
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ntụgharị Uche nke Bara Uru
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 2/15 p. 29

“Ụmụaka Kwesịrị Ịma Chineke”

NA Disemba 9, n’afọ 2008, e nwere otu nnọkọ pụrụ iche nke ụlọ ọrụ Swiden nke na-ahụ maka ihe ndị ruuru ụmụaka haziri. Isiokwu nnọkọ ahụ bụ: “Ụmụaka Kwesịrị Ịma Chineke.” Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị nọchitere anya Chọọchị Swiden, na ndị nke chọọchị ndị ọzọ, ndị Alakụba, na òtù na-ahụ maka ihe ruuru ndị mmadụ, kwuru okwu n’isiokwu a.

Otu n’ime ndị kwuru okwu ná nnọkọ ahụ bụ otu ụkọchukwu, bụ́ onye sịrị: “Akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl ga-enyere ụmụaka aka dị ukwuu ịmara Chineke.” Olee otú akụkọ ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Nsọ ga-esi eme ka ụmụaka mara Chineke?

Ụkọchukwu ahụ kwukwara, sị: “Akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na-enyere ụmụaka aka ịtụgharị uche n’onwe ha.” O kwuru banyere “akụkọ Adam na Iv, nke Ken na Ebel, nke Devid na Golayat, ọmụmụ Jizọs, ọnaụtụ bụ́ Zakịọs, ihe atụ e ji nwa mmefu mee, nke e ji onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi mee.” Akụkọ ndị a bụ “ụfọdụ n’ime akụkọ ndị na-enyere ụmụaka aka ichebara ihe ndị dị mkpa ná ndụ ha echiche, ya bụ, ihe ndị dị ka ekwesịghị ntụkwasị obi, ịgbaghara mmehie, ịkpọasị, omume rụrụ arụ, nchegharị, na ịhụnanya.” O kwukwara, sị: “Akụkọ ndị a nwere ike ime ka ụmụaka na-akpa ezigbo àgwà wee baa uru ná ndụ.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị mma ka a kụziere ụmụaka ka ha na-agụ Baịbụl. Ma, ụmụaka hà nwere ike “ịtụgharị uche” n’ihe ha gụtara n’Akwụkwọ Nsọ ma ghọta ihe ọ na-ekwu n’enweghị onye nyeere ha aka?

A na-akọwara ndị torola eto ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, ma ya fọdụzie ụmụaka. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị banyere otu nwoke nke na-aghọtaghị ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ ‘na-atụgharị uche’ n’enweghị onye nyeere ya aka. Nwoke ahụ bụ onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị Itiopia. Ọ nọ na-agụ amụma Aịzaya, ma, ọ ghọtaghị ihe ọ pụtara. Mgbe onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Filip chọrọ ịkọwara ya ihe amụma ahụ pụtara, o kwetara n’ihi na ọ dị ya mkpa ịghọta ya. (Ọrụ 8:26-40) Ọ bụghị naanị onye Itiopia ahụ ka ụdị ihe a na-eme. Ịkọwara anyị Akwụkwọ Nsọ dị anyị niile mkpa, karịchaa, ụmụaka.

Baịbụl gwara anyị, sị: “Nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata.” (Ilu 22:15) Nduzi dị ụmụaka mkpa, ọ bụkwa ndị nne ha na nna ha ka ọ dịịrị ịkụziri ha otú ha ga-esi na-akpa ezigbo àgwà, bụ́ nke Baịbụl na ọmụmụ ihe ọgbakọ ga-enyere ha aka ime. E kwesịrị iji otú a na-azụ ụmụaka. E kwesịrị ịmalite ịkụziri ha Baịbụl mgbe a ka ku ha n’aka ka ha wee mara ya nke ọma. Nke a nwere ike ime ka ha bụrụ “ndị tozuru okè, ndị zụworo ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.”—Hib. 5:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya