Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 11/1 p. 3
  • Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịdị Umeala n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịdị Umeala n’Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ihe Atụ nke Obi Umeala Ndị A Ga-eṅomi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 11/1 p. 3

Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịdị Umeala n’Obi

O NWERE ike ịdị ọtụtụ ndị ka mmadụ ịdị umeala n’obi abaghị uru ọ bụla taa. Ndị a na-akwanyere ùgwù na ndị o yiri ka ihe ọ kasị agaziri bụ ndị na-achọkarị ịnọ n’isi, ndị dị mpako, na ndị na-achọkarị ka okwu na-ebi n’ọnụ ha. Kama iṅomi ndị dị umeala n’obi, ọtụtụ ndị na-eṅomi ndị ji ego na ndị a ma ama. Ndị ihe gaziiri na-etukarị ọnụ na ihe mere ha ji nwee ihe ịga nke ọma bụ n’ihi na ha na-arụsi ọrụ ike. Kama ịdị umeala n’obi, nganga na-eme ka ha na-eto onwe ha maka ihe ịga nke ọma ha nwere.

Onye Canada na-eme nnyocha kwuru na e nwere “àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị” n’obodo ya. Ndị ọzọ na-eche na anyị bi n’ime ụwa ebe ndị mmadụ weere ikpori ndụ dị ka ihe dị mkpa karịa ịkpa àgwà dị mma, ha chọpụtara na ndị mmadụ taa na-echekarị banyere nanị onwe ha. Ọ ga-esi ike ndị mmadụ ịdị umeala n’obi n’ụwa dị otú a.

N’ezie, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ kweere na ịdị umeala n’obi bụ àgwà kwesịrị ekwesị, n’ihi na ọ na-adị mfe iso ndị dị umeala n’obi na-emekọrịta ihe. Ma, n’ụwa a onye ọ bụla na-asọrịta mpi, ụfọdụ na-atụ ụjọ na ọ bụrụ na ha adị umeala n’obi, ndị ọzọ ga-ewere ha dị ka ndị na-adịghị ike.

Okwu Chineke bụ́ Bible buru n’amụma na n’oge anyị a, ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-anya isi, ndị mpako.” (2 Timoti 3:1, 2) Ì kwetaghị na amụma a na-emezu taa? Ì chere na mmadụ ịdị umeala n’obi bara uru? Ka ì chere na a ga-ewere onye dị umeala n’obi dị ka onye na-adịghị ike, onye ndị ọzọ ga na-akagide anya?

Nke bụ́ eziokwu bụ na Bible kwuru ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji were ịdị umeala n’obi dị ka ihe bara uru kwuokwa ihe mere anyị kwesịrị iji dịrị umeala n’obi. O kwuru ụzọ anyị kwesịrị isi na-ele ịdị umeala n’obi anya, gosikwa na ezi ịdị umeala n’obi adịghị egosi na mmadụ adịghị ike kama ọ na-egosi na onye ahụ dị ike. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe mere anyị ji kwuo otú a.

[Foto dị na peeji nke 3]

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ihe ndị anyị rụzuru anya?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya