Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 9/15 p. 32
  • “Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 9/15 p. 32

“Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”

ABỤ ỌMA nke 119 bụ abụ nke na-egosi otú obi dị onye dere ya n’ebe ozi, ma ọ bụ okwu, Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ dị. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “N’obi m ka m zobeworo okwu ọnụ Gị.” “Ihe ụkpụrụ Gị nile ga-atọ m ụtọ nke ukwuu.” “Mkpụrụ obi m etiwawo n’ihi ọchịchọ o ji chọsie ikpe Gị nile ike mgbe nile.” “Ihe àmà Gị nile bụ ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu.” “Achọsiwo m ihe ịrịba ama Gị nile ike.” “Ihe nke ihe nile I nyere n’iwu ga-atọkwa m ụtọ nke ukwuu, bụ́ nke m hụworo n’anya.” “M ga-atụgharịkwa uche n’ụkpụrụ Gị nile.” “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.”—Abụ Ọma 119:11, 16, 20, 24, 40, 47, 48, 97.

Lee ka ọbụ abụ ahụ si gosipụta ekele sitere n’obi o nwere maka okwu Chineke e dere ede! Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ele ozi dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, anya? Ị̀ ga-achọ ịhụ ya n’anya otú ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịmụta ịdị na-agụchi Bible anya, ya dị mfe, na-agụ ya kwa ụbọchị. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.” (Matiu 4:4) Ihe nke abụọ i kwesịrị ime bụ ịdị na-atụgharị uche n’ihe ị gụrụ. Iche echiche banyere eziokwu banyere Chineke, àgwà ya, uche ya, na nzube ya ga-eme ka i kelekwuo Jehova maka inye anyị Bible. (Abụ Ọma 143:5) Gbalịakwa ike gị nile itinye ọmarịcha ndụmọdụ ndị ị na-agụta na ya n’ọrụ ná ndụ ị na-adị kwa ụbọchị.—Luk 11:28; Jọn 13:17.

Olee otú ịmụta ịhụ ihe Bible kwuru n’anya ga-esi baara gị uru? Abụ Ọma 119:2 kwuru, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị na-echebe ihe àmà [Chineke] bụ.” Ihe àmà ndị dị na Bible ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ. (Abụ Ọma 1:1-3) Ị ga-enweta amamihe na nghọta bụ́ ndị ga-enyere gị aka ‘igbochi ụkwụ gị ịba n’ụzọ ọjọọ ọ bụla.’ (Abụ Ọma 119:98-101) Ịmata eziokwu banyere Chineke na nzube ya maka ụwa ga-eme ka i nwekwuo obi ụtọ ná ndụ ma mee ka i nwekwuo olileanya maka ọdịnihu.—Aịsaịa 45:18; Jọn 17:3; Mkpughe 21:3, 4.

Ọ na-agụ nnọọ Ndịàmà Jehova agụụ inyere ndị ọzọ aka ịmatakwu Bible na ịmụta ịhụ ozi ndị dị n’ime ya n’anya. Anyị ji obi anyị nile na-arịọ gị ka i detara anyị akwụkwọ dị ka e kwuru n’okpuru ebe a.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya