Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 8/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Ga-eme Ka Ọnwụ, Bụ́ Onye Iro Ikpeazụ, Ghara Ịdị Irè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ụbọchị Ikpe nke Chineke—Ihe Ọṅụ nke Ga-esi na Ya Pụta!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Olee Uru Ọnwụ Jizọs na Mbilite n’Ọnwụ Ya Ga-abara Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 8/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe ule ikpeazụ nke a ga-enwe n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ gasịrị, ụmụ mmadụ hà ga-enwe ike ime mmehie ma nwụọ?

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ dị ná Mkpughe na-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Ha kwuru, sị: “A tụbakwara ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Ọdọ ọkụ ahụ pụtara ọnwụ nke abụọ.” (Mkpughe 20:14) “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:4.

Rịba ama usoro ihe ndị e kwuru okwu ha ebe a ga-eji mee. A ga-atụba “ọnwụ na Hedis” n’ime ọdọ ọkụ ahụ mgbe e kpechara ndị lanahụrụ Amagedọn, ndị a kpọlitere n’ọnwụ na ụmụ a mụrụ mgbe Amagedọn gasịrị ikpe site “n’ihe ndị ahụ e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ,” nke bụ́ akwụkwọ ebe e dere ihe nile ndị Jehova chọrọ ụmụ mmadụ n’aka n’ime otu puku afọ ahụ. (Mkpughe 20:12, 13) Jọn onyeozi dere ọhụụ ọzọ ná Mkpughe isi 21, bụ́ nke ga-emezu n’Ọchịchị Otu Puku Afọ nke Kraịst Jizọs. Otú ọ dị, a ga-emezu ọhụụ ahụ n’ozuzu n’ọgwụgwụ nke Ụbọchị Ikpe ahụ ga-adịru otu puku afọ. Ebe ọ bụ na Jizọs ga-enyeghachila Nna ya Alaeze ahụ, Jehova ga-ebinyeziri ụmụ mmadụ n’onwe ya n’enweghịzi onye ogbugbo n’etiti ya na ha. Jehova n’onwe ya ga-ebikwa n’etiti “ndị ya” n’ụzọ ihe atụ ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emezu nkwa ahụ e kwere nke bụ́ na “ọnwụ agaghị adị ọzọ” n’ụzọ zuru ezu mgbe ụmụ mmadụ zuchara okè n’ihi iji uru nke àjà mgbapụta Kraịst rụọrọ ha ọrụ n’ụzọ zuru ezu.—Mkpughe 21:3, 4.

N’ihi ya, ọnwụ e kwuru banyere ya n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ e hotara n’elu bụ ọnwụ anyị ketara n’aka Adam, bụ́ nke a ga-eji àjà mgbapụta Kraịst wepụ. (Ndị Rom 5:12-21) Mgbe e wepụsịrị ọnwụ ụmụ mmadụ ketara n’aka nwoke mbụ bụ́ Adam, ha ga-adị ka Adam mgbe e kere ya. Adam zuru okè, ma nke ahụ apụtaghị na o nweghị ike ịnwụ anwụ. Jehova gwara Adam ka ọ ghara iri “mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ” ma kwuo, sị: “N’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:17) Ọnwụ ebe ahụ na-ekwu banyere ya bụ ọnwụ Adam ga-anwụ ma ọ mara ụma mee mmehie. Mgbe ule ikpeazụ ahụ gasịrị n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Otu Puku Afọ ahụ, ụmụ mmadụ ka ga-enwe ikike ime nhọrọ. (Mkpughe 20:7-10) Ha ka ga-enwere onwe ha ịhọrọ ma hà ga-anọgide na-ejere Jehova ozi ma ọ bụ na ha agaghị anọgide. Anyị enweghị ike ikwu na ọ dịtụghị mmadụ ga-enupụrụ Chineke isi, otú ahụ Adam nupụụrụ ya.

Gịnị ga-eme onye họọrọ inupụ isi mgbe ule ikpeazụ ahụ gasịrị, mgbe ọnwụ na Hedis na-adịghịkwa? N’oge ahụ, ọnwụ anyị ketara n’aka Adam adịghịzi. Hedis, nke bụ́ ili nkịtị nke ụmụ mmadụ nwere olileanya mbilite n’ọnwụ, adịghịzikwa. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova pụrụ iji ọdọ ọkụ ahụ bibie onye ọ bụla nupụrụ isi, jụkwa ịkpọlite onye ahụ n’ọnwụ. Ọnwụ ahụ ga-eyi ụdị ọnwụ Adam na Iv nwụrụ, ọ bụghị ọnwụ ụmụ mmadụ ketara n’aka Adam.

Otú ọ dị, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji tụwa anya na ihe dị otú ahụ ga-eme. Ọ dị otu ihe ga-eme ka ndị gafere ule ikpeazụ ahụ dị nnọọ iche n’ebe Adam nọ. E leela ha ule n’ụzọ zuru ezu. Anyị pụrụ inwe obi ike na a ga-akpachapụ anya lee ụmụ mmadụ ule ikpeazụ ahụ, n’ihi na Jehova maara nnọọ otú e si enyocha ụmụ mmadụ. Anyị pụrụ inwe obi ike na a ga-ebibi onye ọ bụla ga-eji ikike ime nhọrọ ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, n’ule ikpeazụ ahụ. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ndị gafere ule ikpeazụ ahụ nwere ike inupụrụ Chineke isi, e bibiekwa ha, o yighị nnọọ ka ihe dị otú ahụ ọ̀ ga-eme.

[Foto dị na peeji nke 31]

Mgbe ule ikpeazụ ahụ gasịrị, olee otú ụmụ mmadụ ga-esi yie Adam?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya