Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 11/1 p. 32
  • Ọ̀ Dị Mgbe Anyị Ga-enwe Ezi Nchebe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Mgbe Anyị Ga-enwe Ezi Nchebe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 11/1 p. 32

Ọ̀ Dị Mgbe Anyị Ga-enwe Ezi Nchebe?

ỤMỤAKA nwere obi ụtọ bụ́ ndị ha na ndị mụrụ ha na-ahụ n’anya na-egwuri egwu—ọ̀ dị onye na-adịghị enwe mmasị ikiri ihe dị otú ahụ? Ụmụaka ahụ na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị nọ nnọọ ná nchebe mgbe ha na ndị mụrụ ha na-ahụ n’anya nọ. Ma, nye ọtụtụ ndị na-eto eto, oge obi ụtọ ndị dị otú ahụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-adịghị adị. Kama nke ahụ, ụfọdụ ụmụaka aghaghị ichegbu onwe ha kwa ụbọchị banyere ịchọta ebe ha ga-ehi ụra n’abalị. È nwere olileanya dịnụ maka ụmụaka dị otú ahụ na-enweghị ebe obibi na ndị ọzọ na-anọghị ná nchebe?

Ọ bụ ezie na ọdịnihu pụrụ iyi ihe olileanya na-adịghị, Okwu Chineke na-enye olileanya. Aịzaịa onye amụma buru amụma na ụbọchị ga-abịa mgbe mmadụ nile ga-ebi ná nchebe zuru ezu. O dere, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie.”—Aịsaịa 65:21, 22.

Ma olileanya a ò nwere ihe ndabere siri ike? E kwuwerị, okwu ahụ bụ́ “olileanya” adịghị egosi mgbe nile ihe e ji n’aka. Dị ka ihe atụ, na Brazil, a na-anụkarị okwu bụ́: “A esperança é a última que morre.” N’ụzọ nkịtị ọ pụtara, “Olileanya bụ ihe ikpeazụ na-anwụ.” Nke a na-apụta na ọtụtụ mmadụ na-anọgide na-enwe olileanya ọbụna mgbe a na-enweghị ezi ihe ndabere maka olileanya. Otú ọ dị, olileanya nke Chineke ahụ dị ndụ na-enye anyị dị iche. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ dịghị onye na-eme ka okwukwe ya dabere na [Chineke] nke a ga-emechu ihu.” (Ndị Rom 10:11) Amụma Bible ndị mezuworonụ na-emesi anyị obi ike na nkwa ndị ọzọ nile Jehova Chineke kwere ga-emezukwa. Mgbe e mezuru nkwa ndị a, ọnọdụ ndị na-eme ka ụmụaka na-ebi n’okporo ámá ga-abụ ihe mgbe ochie.

Ọbụna taa ndụmọdụ ndị dị irè a na-achọta n’ime Bible pụrụ inyere ndị na-enweghị olileanya aka ime ka ndụ ka ha mma ma chọta ezi nchebe. Olee otú nke a ga-esi kwee omume? Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịchọta azịza nke ajụjụ a.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya