Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 10/1 p. 32
  • Ọ Karịrị Egwuregwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Karịrị Egwuregwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 10/1 p. 32

Ọ Karịrị Egwuregwu

ỤMỤAKA na-enwe mmasị igwu egwu. Ma “nke a abụghị ihe na-abaghị uru,” ka akwụkwọ bụ́ The Developing Child na-akọwa. “O yiri ka ọ̀ bụ ya na-abụ ntọala nke ihe ọmụma nwatakịrị ga-enwe banyere ihe ndị gbara ya gburugburu.” Site n’igwu egwu, ụmụaka na-amụta iji ikike ha eme ihe, na-aghọta gburugburu ha ma na-eso ndị ọzọ akpakọrịta.

Malite mgbe ha gbara afọ anọ ma ọ bụ ise, ụmụaka ga-amalite imeghachi ihe ndị toworo eto na-eme dị ka akụkụ nke egwuregwu ha. N’otu oge, Jizọs kwuru banyere ụmụaka na-egwuri egwu. Ụfọdụ chọrọ ime ka ndị “na-agba akwụkwọ,” ndị ọzọ chọrọ ime ka ndị na-eme “ememe olili ozu,” dịkwa ka ụmụaka na-emekarị, ha rụrụ ụka n’etiti onwe ha n’ihi na ụfọdụ achọghị ikere òkè. (Matiu 11:16, 17) Ụdị egwuregwu a pụrụ ịkụnye ọrụ ndị bara uru n’uche nwa ka na-eto eto.

Ụmụaka nọ n’ihe osise ndị a na-eme ka onye nkụzi Bible na onye ọ na-akụziri Bible. Nke a abụghị ezigbo ọmụmụ Bible, ma echiche nke ikerịta ozi Bible dị nnọọ n’uche ha. Ihe mmụta a dịkwa mkpa, n’ihi na Jizọs nyere ụmụazụ ya nile iwu ime ndị na-eso ụzọ na ịkụziri mmadụ nile idebe ihe nile ọ kụziiri ha.—Matiu 28:19, 20.

Ndị nne na nna ụmụ ha na-enwe mmasị ime ka à ga-asị na ha na-eduzi ọmụmụ Bible, na-ekwu okwu ná nzukọ, ma ọ bụ na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ kwesịrị inwe obi ụtọ. Dị ka ọ na-adịkarị, ụmụaka na-eṅomi ihe ha hụrụ ndị toworo eto nọ gburugburu ha na-eme. Egwuregwu ụmụaka bụ́ ndị dabeere na Bible na-egosipụta na “e ji ụdị mmụta na ndụmọdụ nke Onyenwe anyị na-anakwere” na-azụlite ha.—Ndị Efesọs 6:4, Charles B. Williams.

Jehova chọrọ ka ụmụaka na-ekere òkè n’ezi ofufe. Ọ gwara Mozis ka “ụmụntakịrị” nọrọ ya mgbe a na-agụ Iwu ahụ. (Deuterọnọmi 31:12) Ọ bụrụ na ụmụaka elee onwe ha anya na e ji ha kpọrọ ihe, o yikarịrị ka egwuregwu ha ọ̀ ga-egosipụta nke a. Nwatakịrị ọ bụla nke na-eme egwuregwu nke ịbụ onye ozi Chineke na-ewere nzọụkwụ mbụ n’ịghọ onye ozi.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya