Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 9/15 p. 32
  • Mgbe Nkwa Bụ Ihe E Ji n’Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Nkwa Bụ Ihe E Ji n’Aka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 9/15 p. 32

Mgbe Nkwa Bụ Ihe E Ji n’Aka

AKỤKỌ ihe mere eme jupụtara ná nkwa ndị a na-emezughị emezu. Mgbe mgbe, mba dị iche iche ajụwo ime ihe kwekọrọ ná nkwekọrịta alụrịtaghị agha ndị ha bịanyere nnọọ aka na ha, si otú a na-eduje ndị ala ha n’agha ndị dị egwu. Napoleon kwuru n’otu oge, sị: “Ndị ọchịchị na-emezu nkwa ha nanị mgbe a manyere ha ime otú ahụ, ma ọ bụ mgbe ha ga-erite uru na ya.”

Gịnị banyere nkwa nke ụmụ mmadụ? Lee ka o si abụ ihe na-akụda obi mgbe mmadụ na-emezughị nkwa ya! Ọ na-adị otú ahụ karịsịa mgbe onye ahụ bụ onye ị maara ma tụkwasị obi. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ụmụ mmadụ enweghị ike ma ọ bụ na ha achọghị imezu nkwa ha.

Leenụ ọdịiche dị n’etiti nkwa ụmụ mmadụ na nke Chineke! Nkwa Chineke bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na ndị a pụrụ ịdabere na ha kpam kpam. Nkwa ọ bụla Jehova Chineke kwere bụ ihe e ji n’aka. Ọ ga-emezurịrị. N’ikwu banyere okwu Chineke nke na-adịghị ada ada, Aịsaịa 55:11 na-ekwu, sị: “Otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta, ọ gaghị alaghịchikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”

Ya mere, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele nkwa Chineke ndị e dekọrọ na Bible anya? Anyị pụrụ ịdabere na ha n’ezie. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi dere, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Ị pụrụ ịnụ ụtọ ngọzi ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na i mee ihe ndị kwekọrọ n’okwu Jizọs bụ́: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ I zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya