Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 7/15 p. 3
  • Ndị Ọzọ Hà Dị Anyị Mkpa N’ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ọzọ Hà Dị Anyị Mkpa N’ezie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Owu Ọmụma Si Na-akakwu Njọ—Ihe Baịbụl Kwuru
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Inwekarị Oké Mmetụta Uche
    Teta!—2001
  • Ihe Mere na Anyị Apụghị Ịnọ n’Adabereghị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Olee Otú Eluigwe na Ala na Ndụ Si Malite?
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 7/15 p. 3

Ndị Ọzọ Hà Dị Anyị Mkpa N’ezie?

“MGBE anyị nyochara ndụ anyị na mbọ ndị anyị na-agba, anyị na-achọpụta n’oge na-adịghị anya na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe nile anyị na-eme na ọchịchọ anyị dum dabeere n’ịdị adị nke ndị ọzọ,” ka ọkà mmụta sayensị ahụ a ma nke ọma bụ́ Albert Einstein kwuru. Ọ gbakwụnyere, sị: “Anyị na-eri nri ndị ọzọ mepụtara, na-eyi ákwà ndị ọzọ kwara, biri n’ụlọ ndị ọzọ wuru. . . . Mmadụ bụ ihe ọ bụ ma na-aghọta na ọ dịghị oké ihe o nwere n’ihi ụdị mmadụ ọ bụ, kama, ọ bụ n’ihi na o so n’ọha mmadụ buru ibu, bụ́ nke na-eduzi ịdị adị ya n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ ime mmụọ site n’oge a mụrụ ya ruo n’oge ọ ga-anwụ.”

A bịa n’etiti ụmụ anụmanụ, a na-ahụkarị imekọ ihe ọnụ dị ka ihe e bu pụta ụwa. Enyí na-agagharị n’ìgwè, jiri nlezianya na-echebe ụmụ ha. Ọdụm ndị nke nne na-achụkọ nta ọnụ, ma na-eso ndị nke oké ekerịta nri ha. Azụ̀ dolphin na-egwukọ egwu ọnụ, ọbụna ha echebewokwa ụmụ anụmanụ ndị ọzọ ma ọ bụ ndị na-egwu mmiri mgbe ha nọ ná nsogbu.

Otú ọ dị, a bịa n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya achọpụtawo otu àgwà nke na-enye ọtụtụ mmadụ nsogbu n’obi. Dị ka otu akwụkwọ akụkọ e bipụtara na Mexico si kwuo, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na “ọha mmadụ nọ na United States ahụsiwo anya n’ihi otú ndị mmadụ siworo na-anọrọ onwe ha ruo ọtụtụ iri afọ na otú imekọ ihe ọnụ si bụrụ ihe na-ala ala.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na “ọdịmma nke mba ahụ dabeere n’ime mgbanwe dị ukwuu ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya, bụ́ nke na-agụnye ịmaliteghachi imekọ ihe ọnụ.”

Nsogbu a amụbawo karịsịa n’etiti ndị bi ná mba ndị mepere emepe. E nwere àgwà na-amụbawanye ngwa ngwa nke ọtụtụ mmadụ ịnọrọ onwe ha. Ndị mmadụ chọrọ ‘ibi ndụ otú o si masị ha’ ma na-eguzogidesi ike ndị ọzọ ‘ịwabata n’ihe ndị dịịrị ha.’ E kwupụtawo echiche bụ́ na àgwà a emewo ka ọha mmadụ na-enwekwu nsogbu nke mmetụta uche, ịda mbà n’obi, na igbu onwe onye.

Dr. Daniel Goleman kwuru banyere nke a, sị: “Ịnọrọ onwe onye—echiche bụ́ na mmadụ enweghị onye ọ bụla ọzọ ọ pụrụ ịkọrọ ihe dị ya n’obi ma ọ bụ onye ya na ya ga na-akpakọrịta—ji okpukpu abụọ na-amụba ohere e nwere ịda ọrịa ma ọ bụ ịnwụ.” Akụkọ e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ Science kwubiri na ịnọrọ onwe onye ‘na-akpata ọnwụ otú ise siga, ọbara mgbali elu, inwe oké abụba, ibu oké ibu, na adịghị emega ahụ́ si akpata.’

Ya mere, e nwere ihe ndị dịgasị iche iche mere ndị ọzọ ji dị anyị mkpa n’ezie. Anyị apụghị ịnọ n’adabereghị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ya mere, olee otú a pụrụ isi dozie nsogbu nke mmadụ ịnọrọ onwe ya? Olee ihe meworo ka ndụ ọtụtụ ndị nwee ezi nzube? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe nile anyị na-eme na ọchịchọ anyị dum dabeere n’ịdị adị nke ndị ọzọ.”—Albert Einstein

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya