Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 5/15 p. 32
  • Họrọ Ndụ Ebighị Ebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Họrọ Ndụ Ebighị Ebi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 5/15 p. 32

Họrọ Ndụ Ebighị Ebi

Ọ DỊBEGHỊ mgbe ọ bụla ọzọ ọtụtụ mmadụ nwere ọtụtụ nhọrọ ime. Dị ka ihe atụ, uwe anyị na-eyi, nri anyị na-eri, na ebe anyị na-arụ ọrụ na ebe anyị bi na-abụkarị ihe a na-eme nhọrọ maka ha. N’ọtụtụ ebe n’ụwa, mmadụ ịhọrọ onye ọ ga-alụ bụkwa ihe a na-emekarị. Otú ọ dị, Bible na-egosi nhọrọ nke karịrị nhọrọ ndị ọzọ nile—nke gheere oghe nye ihe nile a kpọrọ mmadụ.

Bible na-ekwu, sị: “Onye na-eguzosi ike n’ezi omume ga-eru ná ndụ: ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-eru n’ọnwụ nke aka ya.” (Ilu 11:19) Jizọs Kraịst kwukwara, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ee, Onye Okike anyị enyewo anyị ohere nke ịhọrọ ụzọ pụrụ iduba anyị ná ndụ ebighị ebi! Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta ndụ ebighị ebi?

Dị ka Bible si kwuo, “n’ụzọ ezi omume ka ndụ dị.” (Ilu 12:28) Anyị pụrụ iso ná ndị ezi omume bụ́ ndị nọ n’ụzọ nke ndụ ebighị ebi. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ijide n’aka na ndụ anyị kwekọrọ n’uche Chineke na n’iwu ya. (Matiu 7:13, 14) Ya mere, ka anyị mee nhọrọ ziri ezi ma nweta onyinye nke ndụ ebighị ebi nke Chineke na-enye.—Ndị Rom 6:23.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya