Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 5/15 p. 3
  • Ihe Ndekọ Njem nke Na-akpali Mmasị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndekọ Njem nke Na-akpali Mmasị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ—Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Nkịtị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ụgbọ Noa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 5/15 p. 3

Ihe Ndekọ Njem nke Na-akpali Mmasị

ONYE nchọpụta bụ́ Richard E. Byrd gara Antarctica ugboro ise site na 1928 ruo 1956. Site n’idetu ihe n’akwụkwọ ndetu ihe nakwa site n’idekọ ihe ndị ziri ezi n’akwụkwọ ndekọ njem ha, ya na ndị òtù ya bịara nwee ike ịmata ebe ndị ifufe na-eche ihu, nwee ike ise map na ịmata ọtụtụ ihe banyere kọntinent Antarctica.

Njem Byrd na-egosi uru ọ bara inwe ihe ndekọ njem. Ihe ndekọ dị otú ahụ na-agụnye ihe ndị merenụ mgbe e ji ụgbọ mmiri ma ọ bụ ụgbọelu na-eme njem. A pụrụ iji ihe ọmụma a tụleghachi ihe ndị merenụ ma ọ bụ jiri ya chọpụta ihe ọmụma ndị a pụrụ iji mee ihe na njem ndị a ga-eme n’ọdịnihu.

Akwụkwọ Nsọ na-enye ihe ndekọ na-adọrọ mmasị banyere Iju Mmiri ahụ mere n’oge Noa. Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ dịgidere ruo ihe karịrị otu afọ. Ka ha na-ejikere maka Iju Mmiri ahụ, Noa, nwunye ya, na ụmụ ha nwoke na ndị nwunye ha ji afọ 50 ma ọ bụ 60 wuo otu ụgbọ—nnukwu ụgbọ nke ime ya dị ihe dị ka cubic mita 40,000. Gịnị bụ nzube e ji wuo ya? Ọ bụ iji chebe ụfọdụ mmadụ na ụmụ anụmanụ ndụ gabiga Iju Mmiri ahụ.—Jenesis 7:1-3.

Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis nwere ihe a pụrụ ịkpọ ihe ndekọ njem Noa bụ́ nke nwere ihe ndekọ nke ihe ndị merenụ site ná mmalite Iju Mmiri ahụ ruo mgbe ya na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta. Ọ̀ dị ihe ọ bụla e dere na ya nke pụrụ ịbara anyị uru taa?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya