Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 3/1 p. 19
  • ‘E Mewo Ka Ịhụnanya Anyị Mikwuo Emie’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘E Mewo Ka Ịhụnanya Anyị Mikwuo Emie’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 3/1 p. 19

‘E Mewo Ka Ịhụnanya Anyị Mikwuo Emie’

NA Friday, March 31, 2000, Ugwu Usu nke dị na Hokkaido, Japan, gbawara ka ọ nọsịrị jụụ ruo afọ 23. A manyere ọtụtụ puku ndị bi na ya isi n’ógbè ahụ dị ize ndụ gbapụ. Ebe obibi na ọrụ nke ọtụtụ ndị funahụrụ ha, ma n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ dịghị onye n’ime ha nwụrụnụ. Ndịàmà Jehova 46 so ná ndị gbapụrụnụ, ma a hapụghị ha n’enyeghịrị ha aka.

Kpọmkwem n’ụbọchị ugwu ahụ gbawara, site n’enyemaka nke onye ozi na-ejegharị ejegharị nke Ndị Kraịst bụ́ onye na-eje ozi n’ógbè ahụ, e mere ndokwa maka ọrụ enyemaka. N’oge na-adịghị anya, e si n’ọgbakọ ndị dị nso bubatawa ihe enyemaka. N’okpuru nlekọta nke alaka Japan, e guzobere kọmitii ọrụ enyemaka ngwa ngwa, Ndịàmà Jehova nọ n’ebe nile na Japan nyekwara onyinye dị ukwuu iji nye aka. Iji kwadoo ọrụ ime mmụọ, e zigara ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova n’ọgbakọ ọ kasị metụta, onye nlekọta sekit letakwara ógbè ahụ ugboro ugboro iji nye nkwado n’ụzọ mmetụta uche na nke ime mmụọ.

Ndịàmà nọ n’ógbè ihe ahụ mere nọgidere na-enwe nzukọ Ndị Kraịst ha n’oge ahụ tara akpụ site n’iji ebe obibi ndị dị n’ógbè katụ nchebe mee ihe. Mgbe e kwuru ka a lọghachi n’ógbè ahụ Ụlọ Nzukọ Alaeze dị, ụmụnna lọghachiri ma hụ ụlọ na-achọ ịda ada nke ahụ́ ya gbawasịwororịị ma mebisịa. N’ebe na-adịghị anya site n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, nnukwu anwụrụ ọkụ ka si n’ugwu ahụ gbawara ọhụrụ na-enupụta. Ndịàmà ahụ chere echiche, sị: ‘Ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịnọgide na-enwe nzukọ n’ebe a? À pụrụ ịrụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze a?’

E kpebiri iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’ebe dị nso ma dị nchebe karị. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè nyere aka n’ụzọ dị mkpa. E ji ego Ndịàmà nọ n’ebe nile ná mba ahụ nyere n’onyinye wuo ihe owuwu a. A zụtara ala ngwa ngwa, sitekwa n’enyemaka nke ọtụtụ narị ndị ọrụ afọ ofufo, e wuchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’oge dị nnọọ mkpirikpi. Na Sunday, July 23, 2000, mmadụ 75 gara nzukọ mbụ a nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze a e wuru ọhụrụ nwee. Anya mmiri nke ọṅụ gbara ọtụtụ ndị gara ya. Mgbe a raara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nye n’October nke afọ ahụ, a kpaliri otu n’ime ndị okenye nke ọgbakọ dị n’ógbè ahụ ikwu, sị: “Mgbawa ahụ kpatara ihe isi ike na nhụjuanya. Ma, ihe owuwu a agbanwewo egwu anyị ịghọ ọṅụ. E mewo ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst anyị hụrụ n’anya nọ mikwuo emie!”

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

Mgbawa nke Ugwu Usu: AP Photo/Koji Sasahara

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya