‘E Mewo Ka Ịhụnanya Anyị Mikwuo Emie’
NA Friday, March 31, 2000, Ugwu Usu nke dị na Hokkaido, Japan, gbawara ka ọ nọsịrị jụụ ruo afọ 23. A manyere ọtụtụ puku ndị bi na ya isi n’ógbè ahụ dị ize ndụ gbapụ. Ebe obibi na ọrụ nke ọtụtụ ndị funahụrụ ha, ma n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ dịghị onye n’ime ha nwụrụnụ. Ndịàmà Jehova 46 so ná ndị gbapụrụnụ, ma a hapụghị ha n’enyeghịrị ha aka.
Kpọmkwem n’ụbọchị ugwu ahụ gbawara, site n’enyemaka nke onye ozi na-ejegharị ejegharị nke Ndị Kraịst bụ́ onye na-eje ozi n’ógbè ahụ, e mere ndokwa maka ọrụ enyemaka. N’oge na-adịghị anya, e si n’ọgbakọ ndị dị nso bubatawa ihe enyemaka. N’okpuru nlekọta nke alaka Japan, e guzobere kọmitii ọrụ enyemaka ngwa ngwa, Ndịàmà Jehova nọ n’ebe nile na Japan nyekwara onyinye dị ukwuu iji nye aka. Iji kwadoo ọrụ ime mmụọ, e zigara ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova n’ọgbakọ ọ kasị metụta, onye nlekọta sekit letakwara ógbè ahụ ugboro ugboro iji nye nkwado n’ụzọ mmetụta uche na nke ime mmụọ.
Ndịàmà nọ n’ógbè ihe ahụ mere nọgidere na-enwe nzukọ Ndị Kraịst ha n’oge ahụ tara akpụ site n’iji ebe obibi ndị dị n’ógbè katụ nchebe mee ihe. Mgbe e kwuru ka a lọghachi n’ógbè ahụ Ụlọ Nzukọ Alaeze dị, ụmụnna lọghachiri ma hụ ụlọ na-achọ ịda ada nke ahụ́ ya gbawasịwororịị ma mebisịa. N’ebe na-adịghị anya site n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, nnukwu anwụrụ ọkụ ka si n’ugwu ahụ gbawara ọhụrụ na-enupụta. Ndịàmà ahụ chere echiche, sị: ‘Ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịnọgide na-enwe nzukọ n’ebe a? À pụrụ ịrụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze a?’
E kpebiri iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’ebe dị nso ma dị nchebe karị. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè nyere aka n’ụzọ dị mkpa. E ji ego Ndịàmà nọ n’ebe nile ná mba ahụ nyere n’onyinye wuo ihe owuwu a. A zụtara ala ngwa ngwa, sitekwa n’enyemaka nke ọtụtụ narị ndị ọrụ afọ ofufo, e wuchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’oge dị nnọọ mkpirikpi. Na Sunday, July 23, 2000, mmadụ 75 gara nzukọ mbụ a nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze a e wuru ọhụrụ nwee. Anya mmiri nke ọṅụ gbara ọtụtụ ndị gara ya. Mgbe a raara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nye n’October nke afọ ahụ, a kpaliri otu n’ime ndị okenye nke ọgbakọ dị n’ógbè ahụ ikwu, sị: “Mgbawa ahụ kpatara ihe isi ike na nhụjuanya. Ma, ihe owuwu a agbanwewo egwu anyị ịghọ ọṅụ. E mewo ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst anyị hụrụ n’anya nọ mikwuo emie!”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]
Mgbawa nke Ugwu Usu: AP Photo/Koji Sasahara