Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 12/1 p. 32
  • “N’ìhè Gị Ka Anyị Na-ahụ Ìhè”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “N’ìhè Gị Ka Anyị Na-ahụ Ìhè”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 12/1 p. 32

“N’ìhè Gị Ka Anyị Na-ahụ Ìhè”

ÌHÈ bụ ihe anyị na-adịkarịghị eji akpọrọ ihe ruo mgbe e weere ọkụ, gburugburu ebe anyị bi agbaakwa ọchịchịrị. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, “ụlọ ọrụ eletrik” anyị dị n’eluigwe—anyanwụ—bụ nke a pụrụ ịdabere na ya kpam kpam. N’ihi ìhè sikwa n’anyanwụ, anyị pụrụ ịhụ ụzọ, iri ihe, iku ume, na ịdị ndụ.

Ebe ọ bụ na ìhè dị oké mkpa maka ndụ, o kwesịghị iju anyị anya ịgụ na Jenesis na ìhè pụtara n’ụbọchị mbụ nke okike. “Chineke wee sị, Ka ìhè dị: ìhè wee dị.” (Jenesis 1:3) Ndị ikom na-atụ egwu Chineke dị ka Eze Devid adịlarị anya ha matara Jehova dị ka isi iyi nke ndụ na ìhè. “N’ebe Ị nọ ka isi iyi ndụ dị,” ka Devid dere. “N’ìhè Gị ka anyị na-ahụ ìhè.”—Abụ Ọma 36:9.

Okwu Devid dị irè ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ihe atụ. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “N’ezie, ọ bụ ìhè na-akpata ịhụ ụzọ.” Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ihe ọmụma na-esi n’anya abanye n’ụbụrụ karịa ka ọ na-esi n’ikike ndị ọzọ e ji amata ihe.” Ebe ihe ka ukwuu n’ihe anyị na-amụta na-adabere n’onyinye nke ịhụ ụzọ—nke chọrọ ìhè iji na-arụ ọrụ nke ọma—e jikwa ìhè mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ ihe atụ.

N’ihi ya, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ onwe m bụ Ìhè nke ụwa: onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe Ìhè nke ndụ.” (Jọn 8:12) Ìhè ihe atụ Jisọs zoro aka na ya bụ ozi nke eziokwu o kwusara, bụ́ nke pụrụ ime ka uche na obi nke ndị na-ege ya ntị nwupụ. Mgbe ọtụtụ afọ nke ịnọ n’ọchịchịrị ime mmụọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs mesịrị nwee ike ịghọta nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ na olileanya nke Alaeze ahụ. Nke a bụ “Ìhè nke ndụ” n’ezie, ebe ọ bụ na ihe ọmụma ahụ pụrụ iduga ná ndụ ebighị ebi. “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ,” ka Jisọs kwuru n’ekpere o kpekuru Nna ya nke eluigwe, “ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ka ọ ghara ịdị mgbe anyị na-agaghị eji ìhè ime mmụọ a kpọrọ ihe!

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya