Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 11/15 p. 32
  • “Anyị Ga-ahụ n’Alaeze Chineke”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Anyị Ga-ahụ n’Alaeze Chineke”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 11/15 p. 32

“Anyị Ga-ahụ n’Alaeze Chineke”

“Ezigbo enyi m! Rupert, taa, a mara m ikpe ọnwụ. Erurula m újú. Jide n’aka na ahụrụ m gị na ndị nile nọ n’ụlọ n’anya. Anyị ga-ahụ n’Alaeze Chineke.”

NA June 8, 1942, Franc Drozg dere okwu ndị a minit ole na ole tupu ndị agha Nazi agbagbuo ya. Gịnị mere e ji gbagbuo ya?

Dị ka ihe ndekọ dị n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Nnwere Onwe Mba dị na Maribor, Slovenia, si kwuo, ọkpụ ụzụ́ a dị afọ 38 jụrụ isonyere Wehrmannschaft, bụ́ òtù ndị agha Germany nọ na Slovenia nke Germany weghaara. Ọ bụ onye Bibelforsche, ma ọ bụ Onye Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’ógbè ahụ mgbe ahụ. N’ime ihe kwekọrọ n’Aịsaịa 2:4, ọ gaghị akwado agha ndị Nazi na-ebu, na-ekwupụta na ya bụ onye Alaeze Chineke na-achị.—Matiu 6:33.

N’obodo Franc bụ́ Ptuj, a maara ya dị ka onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) N’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike o nwere, o kwusara ozi ọma ahụ n’esepụghị aka ruo mgbe e jidere ya na May 1942.

Ndị Nazi kpagburu ọtụtụ Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Slovenia n’ụzọ kpụ ọkụ ọnụ. Franc so ná ndị mbụ n’ime ha a gbagburu n’ihi nkwenkwe okpukpe ya. Dị ka ndị Kraịst narị afọ mbụ, okwu ndị a wusiri ya ike: “Anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke.” (Ọrụ 14:22) Okwukwe o nwere n’ịdị adị nke ọchịchị eluigwe ahụ pụtara ìhè n’okwu ikpeazụ o kwuru, “Anyị ga-ahụ n’Alaeze Chineke.”

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 32]

Franc Drozg: Foto Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Nnwere Onwe Mba dị na Maribor, Slovenia; akwụkwọ ozi: E debere nke o ji aka ya dee n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Nnwere Onwe Mba dị na Maribor, Slovenia

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya