“Ihe Ize Ndụ Zoro Ezo Nye Ahụ Ike Ọha”
N’ỤZỌ dị ịtụnanya, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị toruworo ogo mmadụ bụ́ ndị na-eji internet eme ihe na United States eletawo ụdị ụfọdụ nke ógbè mmekọahụ, ka nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya banyere mmekọahụ n’Internet kpughere. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmadụ jizi Internet emeju agụụ mmekọahụ ha. “Nke a bụ ihe ize ndụ zoro ezo nye ahụ ike ọha bụ́ nke na-etiwapụ, n’otu akụkụ, n’ihi na ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-aghọta ya otú ahụ ma ọ bụ na-ewere ya dị ka ihe a na-agaghị eji gwurie egwu,” ka Dr. Al Cooper, bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ nke mere nnyocha ahụ na-ekwu.
Olee ndị mmekọahụ dị otú ahụ a na-enwe n’Internet na-emetụta karịsịa? Ọ bụ “ndị ji Internet eme ihe bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na a bịadawo ma kpaara ike mmekọahụ ha ókè ná ndụ ha nile” ma bụrụ ndị “chọtara, na mberede, ohere ndị na-adịghị agwụ agwụ ha ga-eji na-emeju agụụ mmekọahụ ha” n’Internet, ka Dr. Cooper na-ekwu.
Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-aga n’ógbè mmekọahụ mgbe nile na-ewere omume ahụ dị ka ihe na-adịghị emerụ ahụ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị? Dị nnọọ ka ahụ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ si amalite ịnabatawa ọgwụ ndị ahụ riri ya ahụ, ọtụtụ ndị mmekọahụ Internet riri ahụ na-achọ “ọ̀tụ̀tụ̀” hikwuru nne nke mmekọahụ n’Internet iji mejuo oké ọchịchọ ha. Leenụ, ha pụrụ ọbụna itinye ọrụ ha na mmekọrịta ha na di ma ọ bụ nwunye ha n’ihe ize ndụ!
Otú ọ dị, ndị na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ nwere ihe ọzọ mere ha ga-eji zere ileta ógbè mmekọahụ n’Internet. Okwu Chineke na-adọ aka ná ntị, sị: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị; ọ bụkwa n’ihi ihe ndị a ka iwe Chineke na-abịakwasị ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye.” (Ndị Kọlọsi 3:5, 6) Ka mmadụ wee ‘mee ka ihe nile dị ya n’ahụ nwụọ’ ma a bịa n’ihe metụtara agụụ mmekọahụ na-adịghị ọcha, ọ dị ya mkpa ịzụlite ịhụnanya siri ike n’ebe Jehova Chineke nọ. (Abụ Ọma 97:10) Ọ bụrụ na ọ hụta onwe ya dị ka onye a na-araba n’ihe ahụ dị ize ndụ nye ahụ ike ọha bụ́ mmekọahụ Internet, o kwesịrị ime ka ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike site n’ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. Iso Ndịàmà Jehova na-enwe mmekọrịta dị mma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụrụ ime ihe dị ukwuu n’inyere mmadụ aka ime ka mkpebi ya ime ihe na-atọ Chineke ụtọ sikwuo ike.