Ihe Omume Ị Na-ekwesịghị Ịhapụ
“Ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye” na-esi n’aka Chineke, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, abịa. —Jemes 1:17.
ONYINYE kasị ukwuu nke Chineke nyeworo ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie bụ ndokwa maka ịzọpụta ha pụọ n’aka mmehie na ezughị okè site n’aka Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọnwụ Jisọs, bụ́ Onye Mgbapụta anyị, na-eme ka ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs kwe omume. Na Luk 22:19, e nyere anyị iwu ịdị na-echeta ọnwụ ya.
Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù isoro ha kere òkè n’idebe iwu Jisọs nyere. Ememe a a na-eme kwa afọ ga-ewere ọnọdụ mgbe anyanwụ dasịrị n’ụbọchị kwekọrọ na Nisan 14 na kalenda Bible nke e ji ọnwa agụ—Sunday, April 8, 2001. Detuo ụbọchị a ka ị ghara ichezọ ya. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị pụrụ ịgwa gị kpọmkwem ebe na oge a ga-ezukọ.