Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 1/15 p. 32
  • Otú Ha Si Eguzogide Nrụgide Ndị Ọgbọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ha Si Eguzogide Nrụgide Ndị Ọgbọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 1/15 p. 32

Otú Ha Si Eguzogide Nrụgide Ndị Ọgbọ

ỌCHỊCHỌ nke ịbụ ndị a nakweere na-eme ka ọtụtụ ndị na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’echiche na n’omume nke ndị ọgbọ ha. Ikike nke ịjụ omume ndị na-emerụ ahụ, dị ka ịṅụ ọgwụ ọjọọ na mmekọahụ rụrụ arụ, dị ndị na-eto eto mkpa karịsịa. Hà pụrụ isi aṅaa guzogide nrụgide ndị ọgbọ?

Ụmụ agbọghọ abụọ dị afọ iri na ụma bụ́ ndị nọ na Poland dere, sị: “A na-ahụ mmụọ nke ụwa nke ọma n’etiti ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ anyị. Ha na-aghọ aghụghọ n’ule ha, na-eji okwu rere ure eme ihe, na-eyikarị uwe na-ewu ewu, na-akpọkarịkwa egwú a na-achịkwaghị achịkwa na nke rụrụ arụ. Lee obi ụtọ anyị nwere inwe isiokwu ndị a na-ede banyere anyị bụ́ ndị na-eto eto, ndị na-echebekwa anyị pụọ ná mmetụta nke ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị na-adịghị enwe afọ ojuju ma na-enupụ isi!

“Ọnụ apụghị ikwupụta ekele anyị na-enwe maka isiokwu Ụlọ Nche ndị kụbaworo n’ime obi anyị na anyị dị mkpa dị ka ndị na-eto eto ma bụrụ ndị e ji kpọrọ ihe. Ndụmọdụ Bible ndị anyị nwetaworo enyeworo anyị aka iduzi nzọụkwụ anyị nke ọma iji wee nọgide na-eme Jehova Chineke obi ụtọ. Anyị kwenyesiri ike na iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi bụ ụzọ ndụ kasị mma.”

Ee, ndị na-eto eto pụrụ iguzogide nrụgide ndị ọgbọ. Site n’ịzụ “[ike] nghọta” ha, ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst na-amụta ime mkpebi ndị amamihe dị na ha bụ́ ndị na-adịghị egosipụta “mmụọ nke ụwa,” kama, “Mmụọ Nke sitere na Chineke.”—Ndị Hibru 5:14; 1 Ndị Kọrint 2:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya