Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 12/15 p. 32
  • “Ihe Kwesịrị Iwetara Mmadụ Nile Ọṅụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ihe Kwesịrị Iwetara Mmadụ Nile Ọṅụ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 12/15 p. 32

“Ihe Kwesịrị Iwetara Mmadụ Nile Ọṅụ”

IHE dị ka mmadụ 10,500 bi na Tuvalu, bụ́ ọmarịcha mba nke àgwàetiti itoolu ndị dị n’Ebe Ndịda Pacific mejupụtara. Ma, n’ịghọta na Chineke “na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu,” ọ gụsiri Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè ahụ agụụ ike inwe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, n’asụsụ ha. (1 Timoti 2:4) Nke a wetara ihe ịma aka, ebe ọ bụ na e nweghị akwụkwọ ọkọwa okwu n’asụsụ ahụ. Na 1979, otu onye ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova bụ́ onye na-eje ozi na Tuvalu nakweere ihe ịma aka ahụ. Ya na nwunye ya so otu ezinụlọ bi n’ógbè ahụ biri, ha mụtara asụsụ ahụ, ma jiri nke nta nke nta depụta okwu Tuvaluan ụfọdụ na ihe ndị ha pụtara. Ka ọ na-erule 1984, Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’asụsụ Tuvaluan.

Dr. T. Puapua, onye bụbu praịm minista Tuvalu, dere otu akwụkwọ ozi o ji gosi ekele o nwere maka akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi ahụ. O dere, sị: “Akwụkwọ a bụkwa ihe ọhụrụ ọzọ dị mkpa a tụkwasịrị ‘n’akụ̀’ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Tuvalu. Unu kwesịrị inwe nnọọ obi ụtọ n’òkè unu kerewooro—òkè magburu onwe ya n’iwulite ndụ ime mmụọ nke ndị nọ ná mba a. Ekweere m na a ga-edebanye akwụkwọ a n’akụkọ ihe mere eme nke Tuvalu ma a bịa n’ihe banyere mbipụta nke akwụkwọ ndị e ji amụ ihe. . . . [Ihe a a rụzuru] bụ ihe kwesịrị iwetara mmadụ nile ọṅụ.”

Okwu dị iche iche ndị nsụgharị ahụ ji nke nta nke nta depụtasịa dugara n’ibipụta akwụkwọ ọkọwa okwu nke ji Bekee akọwa okwu dị iche iche nke Tuvaluan, na 1993. Ọ bụ akwụkwọ ọkọwa okwu mbụ e wepụtaara ọha na eze n’asụsụ ahụ. N’oge na-adịbeghị anya, Òtù Na-ahụ Maka Asụsụ Mba Tuvalu rịọrọ ka e nye ha ikike iji ya mee ihe n’iwulite akwụkwọ ọkọwa okwu mbụ ha n’asụsụ mba ahụ.

Kemgbe January 1, 1989, a nọwo na-ebipụta Ụlọ Nche otu ugboro n’ọnwa n’asụsụ Tuvaluan. Ọ bụrụ na ị na-agụ magazin a n’asụsụ ọzọ ị na-asụ, gịnị ma i lee peeji nke 2 iji hụ ma a gụnyere asụsụ obodo gị n’ime asụsụ ndị a na-ebipụta Ụlọ Nche na ha? Obi abụọ adịghị ya na ịgụ ya n’asụsụ obodo gị ga-ewetakwuru gị ọṅụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya