Mma Ime Nwere Abamuru Na-adịgide Adịgide
“NWA OKOROBỊA NA-EWERE MMA NA OMUME ỌMA DỊ KA OTU IHE,” KA OTU ONYE AGADI BỤ́ ONYE KRAỊST NA-EKWESỊ NTỤKWASỊ OBI KWURU.
Ee, ọ dịla anya ndị mmadụ nwewara àgwà nke ilekwasị anya n’ụzọ na-enweghị isi ná mma elu ahụ, na-edugakarị n’inwe echiche na-ezighị ezi banyere omume. Otú ọ dị, Onye Okike anyị na-ele ihe anyị bụ n’ime, n’agbanyeghị otú ọdịdị elu ahụ anyị dị. N’ụzọ dị otú a, ọ na-esetịpụ ihe nlereanya kasịnụ nke ikpe zuru okè. Dị ka Bible si kwuo, Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.”—1 Samuel 16:7.
Chineke bụ Isi Iyi nke ezi ịma mma nke mmadụ, Okwu ya na-ekpughekwa na mgbe a na-atụle ezi uru mmadụ bara, àgwà ime mmụọ kasị adị mkpa. Bible na-ekwu, sị: “Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto.” (Ilu 31:30) N’ezie, ịma mma elu ahụ pụrụ ikpuchi njọ ime ahụ. (Esta 1:10-12; Ilu 11:22) Ọ bụ ezie na mma elu ahụ nwere ike ịpụ n’anya ka oge na-aga, mma ime ahụ—àgwà nke obi—pụrụ ito eto ma dịtee aka.
Ya mere, lee ihe amamihe ọ bụ ịzụlite àgwà ndị dị ka ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè! (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ inweta mma ime, bụ́ nke nwere abamuru na-adịgide adịgide n’ezie.—1 Pita 3:3, 4.