Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 9/1 p. 32
  • Mgbe Ịgbachi Nkịtị Pụtara Nkwenye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ịgbachi Nkịtị Pụtara Nkwenye
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 9/1 p. 32

Mgbe Ịgbachi Nkịtị Pụtara Nkwenye

AKWỤKWỌ bụ́ Betrayal—German Churches and the Holocaust ji ụzọ eziokwu na-akọ banyere òkè okpukpe keere n’Ọchịchị ndị Nazi. “E nwere ọtụtụ ndị kwadoro ọchịchị ahụ n’etiti ndị Kraist,” ka akwụkwọ ahụ na-ekwu, “ihe kakwa ọtụtụ ná ndị mmadụ emegideghị mkpagbu a na-akpagbu ndị Juu. Ịgbachi nkịtị, n’akụkụ a, pụtara ihe dị ukwuu.”

Gịnị dọtara ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst n’ebe Ọchịchị Ndị Nazi dị? “Ụzọ nke ịgbaso iwu na ime ihe n’usoro [nke Hitler ji soo] ndị Germany,” ka akwụkwọ ahụ na-akọwa, ratara ọtụtụ ndị. Ọ na-ekwu, sị: “O megidere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ịgba akwụna, nsikwopụ afọ ime, ndina ụdị onwe, na ‘ịrụ arụ’ nke nkà ọgbara ọhụrụ, o nyekwara ndị inyom mụrụ ụmụ anọ, isii, na asatọ ihe nrite ọla nchara, ọlaọcha, na ọlaedo, si otú ahụ na-agba ha ume ịnọgide na-arụ ọrụ dịịrị ha n’ụlọ dị ka ọdịnala si dị. Hitler ime ka ọdịnala bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ, gụnyere ibu agha ịhụ mba n’anya nke o wepụtara n’ihi nlelị mba ya lelịrị Nkwekọrịta Versailles, mere ka Ọchịchị Ndị Nazi bụrụ nhọrọ na-adọrọ mmasị nye ọtụtụ ndị, ọbụna nye ihe ka ọtụtụ, ná ndị Kraịst nọ na Germany.”

Otu ìgwè gbapụrụ nnọọ iche. “Ndịàmà Jehova,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ Betrayal na-ekwu, “jụrụ ikere òkè n’ime ihe ike ma ọ bụ n’iji usuu ndị agha mee ihe.” N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, nke a dugara ná mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ a wakporo obere ìgwè a, a tụbakwara ọtụtụ n’ime ndị òtù ya n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Ma, ndị ọzọ bụ́ ndị zọọrọ na ha bụ ụmụazụ Kraịst emeghị mkpesa ọ bụla. Akwụkwọ ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Iro ndị Katọlik na ndị Protestant n’ozuzu ha busoro Ndịàmà Jehova karịrị ọmịiko ha nwere n’ebe ha nọ, ha mekwara ihe n’ụzọ obi ọjọọ dị ka Hitler karịa ka ha mere ihe n’ụzọ udo dị ka Ndịàmà.” Obi abụọ adịghị ya na ịgbachi nkịtị ha tinyekwuru ihe ná mmeso ọjọọ e mesoro Ndịàmà n’okpuru ọchịchị Nazi.

Ọ bụ ezie na òkè chọọchị keere n’Ọchịchị Ndị Nazi nọgidere na-abụ ihe na-akpata arụmarụ kpụ ọkụ n’ọnụ, akwụkwọ ahụ bụ́ Betrayal na-akpọ Ndịàmà Jehova “òtù okpukpe nke jụrụ ịkwado ma ọ bụ isonyere ọchịchị ahụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya