Ndụ Gị Ọ̀ Pụrụ Inwe Nzube Ka Ukwuu?
EZI uru ihe bara adịghị adaberekarị n’otú ihe ahụ dị n’anya. Akwụkwọ ego ọnụ ahịa ya kasị ukwuu nke e ji eme ihe na United States bụ $10,000. Ma, ọnụ ahịa akwụkwọ e ji bie ya bụ nanị cent ole na ole.
Ì chetụwo echiche ma mpempe akwụkwọ ọnụ ahịa ha na-ehighị nne hà pụrụ ime ka ndụ gị nwee ezi nzube? Ọtụtụ mmadụ na-eche na ha pụrụ. Ọtụtụ nde mmadụ na-arụ ọrụ ehihie na abalị iji kpata ego ruo otú ike kwere ha. Mgbe ụfọdụ, ịchụ ego na-apụta ikwe ka ahụ ike ha, ndị enyi ha, na ọbụna ezinụlọ ha funahụ ha. Uru gịnị ka nke ahụ bara? Ego—ma ọ bụ ihe anyị na-eji ya azụta—ọ̀ pụrụ iweta ezi afọ ojuju na-adịgide adịgide?
Dị ka ndị nchọpụta si kwuo, ka anyị na-esikwu n’ihe onwunwe achọ inweta afọ ojuju, otú ahụ ka ọ na-abụkwu ihe na-eyighị ka anyị ga-achọta ya. Odeakụkọ bụ́ Alfie Kohn na-ekwubi na “a dịghị nnọọ eji ego azụta afọ ojuju. . . . Ndị weere ịba ọgaranya dị ka ihe mbụ ná ndụ yiri ka ha na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ nchegbu na obi ịda mbà a na-adịghị enwekebe nakwa ọ̀tụ̀tụ̀ dịkwu ala nke ahụ ọma n’ozuzu ya.”—International Herald Tribune.
Ọ bụ ezie na ndị nchọpụta pụrụ ịghọta na ọ bụghị nanị ego ka a chọrọ iji mee ka ndụ nwee nzube, ọtụtụ ndị echeghị otú ahụ. Nke a abụtụghị ihe ijuanya, ebe ọ bụ na a pụrụ imere ndị bi n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa mkpọsa ngwá ahịa ruru nnọọ 3,000 n’otu ụbọchị. Ma ọ̀ bụ ụgbọala ma ọ bụ ihe nracha ka a na-akpọsa, echiche bụ́ isi dị na ya bụ: ‘Zụọ ihe a, ị ga-enwekwa obi ụtọ karị.’
Gịnị si ná nkwalite a na-akwalite ihe onwunwe n’esepụghị aka apụta? Leenụ, a na-elegharakarị ihe ndị bara uru n’ụzọ ime mmụọ anya! Dị ka otu akụkọ dị na magazin bụ́ Newsweek si kwuo, achịbishọp nke Cologne, Germany, kwupụtara n’oge na-adịbeghị anya na “n’ọgbọ anyị, Chineke abụghịzi onye e ji emere isiokwu.”
Ikekwe i tinyewo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ume ọrụ gị nile n’inweta ihe e ji ebi ndụ. Ma eleghị anya ọ na-adị gị ka i nwere oge dị nta iji mee ihe ọ bụla ọzọ. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ịghọta na a ghaghị inwe ihe ọzọ a ga-eji ndụ mee karịa ịnọ na-arụ otu ọrụ mgbe nile ruo mgbe ahụ ike gị ma ọ bụ afọ ndụ gị ga-eme ka ị kwụsị.
Itinyekwu uche n’ihe ime mmụọ ọ̀ pụrụ iwetara gị afọ ojuju ka ukwuu? Gịnị ga-eme ka ndụ gị nwee nzube ka ukwuu?