Inye Ihe nke Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Jehova
Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Mozambique natara akwụkwọ ozi na-esonụ:
“Abụ m nwa okoro dị afọ asaa. M ka na-aga ụlọ akwụkwọ praịmarị. Ana m ezitere unu ego a m kpatara site n’ịkpa otu nwa ọkụkọ. Erere m ya Metical 12,000 [$1.00, U.S.]. Ana m ekele Jehova maka ime ka obere ọkụkọ mbụ m kpatụworo too ghọọ nnukwu oké ọkpa. Aga m enwe mmasị ka e jiri onyinye m mee ihe maka ọrụ Alaeze Jehova.
“Ihe Ịrịba Ama: Papa m nyeere m aka dee akwụkwọ ozi a.”
Ụfọdụ ndị na-ebu n’uche na ọ bụ ndị bara ọgaranya na-emesapụ aka. Otú ọ dị, mgbe anyị gụrụ ihe ndekọ ahụ dị na Bible banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke tụbara “ego nta abụọ” n’igbe ego, anyị pụrụ ịghọta na ọ bụghị ókè ihe hàruru ka e ji atụ mmesapụ aka n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, kama ọ bụ ọchịchọ obi dị mma.—Luk 21:1–4.
Jehova na-enwe ekele maka onyinye ọ bụla sitere n’obi nke ịhụnanya kwaliri, n’agbanyeghị ókè ọ dịruru obere. N’ụba ka ọ na-agọzikwa ndị na-eṅomi mmesapụ aka ya site n’inye oge, ike, ma ọ bụ ihe onwunwe ha n’ihi Alaeze ya.—Matiu 6:33; Ndị Hibru 6:10.