Ime Ka Ọrụ na Ntụrụndụ Nọrọ n’Ọnọdụ Kwesịrị Ekwesị
“NTỤRỤNDỤ bụ uwe mara mma, ma ọ gaghị ezuru mmadụ iyi mgbe nile.” Otu onye a na-akpọghị aha ya ji okwu ndị a kọwaa n’ụzọ ziri ezi uru ntụrụndụ bara. Otú ọ dị, ọ na-egosi na e kwesịrị ime ka ya na ihe omume na-arụpụta ihe nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị.
Onye e nyere ike mmụọ nsọ nke so dee Bible bụ́ Solomọn kwukwara okwu banyere nke a. Eze a maara ihe kọwapụtara akụkụ abụọ gabigara ókè a ga-ezere. Nke mbụ, o kwuru, sị: “Onye nzuzu na-akpakọba aka ya abụọ, na-erikwa anụ ahụ onwe ya.” (Eklisiastis 4:5) Ee, umengwụ pụrụ ime ka mmadụ daa ogbenye. N’ihi ya, ọ pụrụ itinye ahụ ike nke onye umengwu ahụ, ọbụna ndụ ya, n’ihe ize ndụ. N’aka nke ọzọ, ọ dị ndị na-achụ ihe nile n’àjà n’ihi ịrụsi ọrụ ike. Solomọn kọwara ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ezughị ike dị ka “ihe efu na ịchọ ijide ifufe.”—Eklisiastis 4:4.
Ọ dị ezi ihe mere Solomọn ji tụọ aro idebe ihe n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị: “Ọ dị mma, bụ́ otu nju aka n’izu ike, karịa nju aka abụọ n’ịdọgbu onwe gị n’ọrụ na ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:6) Mmadụ kwesịrị ‘ịhụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ’—ya bụ, o kwesịrị iwepụta oge site n’oge ruo n’oge ịnụ ụtọ ihe ndị ọ kpatara. (Eklisiastis 2:24) E kwesịkwara inwe ihe ndị ọzọ ná ndụ ma e wezụga ọrụ ego. O kwesịrị ka anyị wepụta ụfọdụ n’ime oge anyị maka ezinụlọ anyị. Solomọn mesiri ya ike na ibu ọrụ bụ́ isi anyị nwere abụghị ọrụ ego, kama ọ bụ ijere Chineke ozi. (Eklisiastis 12:13) Ì so ná ndị nwere echiche ziri ezi banyere ọrụ?