Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/1 p. 10
  • Nkọwa Bible—Site ná Mmetụta Ònye?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkọwa Bible—Site ná Mmetụta Ònye?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akụkụ 1—Jisọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ọ̀ Bụ Ozizi Bible n’Ụzọ Doro Anya?
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
  • Chineke Ọ̀ Bụ Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Olee Ụzọ E Si Akọwa Atọ n’Ime Otu?
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/1 p. 10

Nkọwa Bible—Site ná Mmetụta Ònye?

OTU nkọwa e nyere okwu ahụ bụ́ “kọwaa” bụ “mmadụ ịghọta ihe site n’ihe ndị o kweere, mkpebi, ma ọ bụ ọnọdụ ya.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) N’ihi ya, ihe mmadụ maara, mmụta, na nzụlite ya na-emetụtakarị otú o si akọwa ihe.

Otú ọ dị, gịnị banyere nkọwa Bible? Ànyị nweere onwe anyị ịkọwa akụkụ dị iche iche nke Bible dị ka ‘ihe ndị anyị kweere, mkpebi, ma ọ bụ ọnọdụ’ anyị si dị? Dị ka ọ na-adịkarị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta na ndị nsụgharị Bible na-azọrọ na ha adịghị eme otú ahụ kama na ọ bụ Chineke na-eduzi ha.

Otu ihe atụ bụ ihe e kwuru ná nkọwa ala ala peji banyere Jọn 1:1 ná nsụgharị bụ́ A New Version of the Four Gospels, nke John Lingard bipụtara na 1836 n’utu aha bụ́ “Onye Katọlik.” Ọ na-ekwu, sị: “Ndị nọ n’okpukpe nile kweere na ha na-achọta ihe na-akwado echiche nke ha n’Akwụkwọ Nsọ: n’ihi na, n’ezie, ọ bụghị Akwụkwọ Nsọ na-agwa ha, kama ọ bụ ha na-agbakwụnye nkọwa nke onwe ha n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.”

Ọ bụ ezie na okwu ahụ ziri ezi, gịnị ka onye dere ya bu n’obi? Okwu ya bụ iji kwado nkọwa ya banyere amaokwu ahụ, bụ́ nke ọ sụgharịrị, ịbụ: “Na mbụ ka ‘okwu ahụ’ dịrị; ‘okwu ahụ’ na Chineke nọkwa; ‘okwu ahụ’ bụkwa Chineke,” kpọmkwem nsụgharị nke na-akwado Atọ n’Ime Otu.

Gịnị kwaliri onye edemede ahụ ịsụgharị Jọn 1:1 n’ụzọ kwadoro ozizi Atọ n’Ime Otu? Ọ̀ bụ “Akwụkwọ Nsọ na-agwa” ya ka o mee otú ahụ? Nke ahụ agaghị ekwe omume ma ọlị n’ihi na ọ dịghị ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ozizi Atọ n’Ime Otu n’ime Bible. Rịba ama ihe The New Encyclopædia Britannica na-ekwu na nke a: “Ma okwu ahụ bụ́ Atọ n’Ime Otu ma ozizi ya doro anya adịghị nke pụtara n’Agba Ọhụrụ.” Tụkwasị na nke a, prọfesọ Mahadum Yale bụ́ E. Washburn Hopkins, kwuru, sị: “O doro anya na Jisọs na Pọl amaghị ozizi atọ n’ime otu; . . . ha ekwughị ihe ọ bụla banyere ya.”

Gịnịzi ka anyị pụrụ ikwubi banyere ndị na-akwado nkọwa nke na-akwado Atọ n’Ime Otu nke Jọn 1:1 ma ọ bụ amaokwu ọ bụla ọzọ nke Bible? N’ịgbaso ụkpụrụ nke Maazị Lingard guzobere, “ọ bụghị Akwụkwọ Nsọ na-agwa ha, kama ọ bụ ha na-agbakwụnye nkọwa nke onwe ha n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.”

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, anyị nwere Okwu Chineke iduzi anyị na nke a. “Unu buru ụzọ mara nke a,” ka Pita onyeozi kwuru, “na ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya. N’ihi na ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.”—2 Pita 1:20, 21.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya