A Kpọọ Aha Chineke n’Israel
ERI ọtụtụ narị afọ, okpukpe ọdịnala ndị Juu amachibidowo ndị na-ekpe ya iwu ịkpọpụta aha Chineke, bụ́ Jehova. Dị ka Mishnah si kwuo, onye ọ bụla nke kpọrọ aha Chineke agaghị enwe “òkè n’ụwa nke na-abịanụ.”—Sanhedrin 10:1.a
Na January 30, 1995, onye Sephardi bụbu onyeisi ndị rabaị nke Israel ma ụma kpọpụta aha Chineke. O mere nke a mgbe ọ na-ekwughachi tikkun, bụ́ ekpere mgbazi nke usoro okpukpe Cabala. A na-ekpe ekpere a ka Chineke wee nwee ike iweghachitetụ udo n’eluigwe na ala, bụ́ nke ikike ndị mmụọ ọjọọ mebiworo, dị ka ndị na-ekpe okpukpe ahụ si kwuo. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Yedioth Aharonoth nke February 6, 1995, kwuru, sị: “Nke a bụ ememe okpukpe nwere ikike na-eju anya nke na okwu ya na-apụta nanị n’akwụkwọ nta pụrụ iche nke a na-adịghị eresị ọha na eze.” E chere na ịkpọku aha Chineke n’ekpere a ga-eme ka arịrịọ ahụ nwee ike pụrụ iche.
Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Bible nyere ndị ohu Chineke iwu iji aha Chineke, bụ́ Jehova, na-eme ihe. (Ọpụpụ 3:15; Ilu 18:10; Aịsaịa 12:4; Zefanaịa 3:9) N’akụkụ ihe odide Hibru mbụ nke Bible, aha ahụ pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000. Otú ọ dị, Bible dọrọ aka ná ntị megide iji aha Chineke eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Nke atọ n’ime Iwu Iri ahụ na-ekwu, sị: “Gị eburula aha Jehova, bụ́ Chineke gị, ime ihe efu; n’ihi na Jehova agaghị agụ onye na-eburu aha Ya ime ihe efu n’onye ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 20:7) Olee otú a pụrụ isi jiri aha Chineke mee ihe efu? Otu nkọwa nke Òtù Ndị Juu Na-ebipụta Akwụkwọ nyere na-ekwu na okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “ime ihe efu” abụghị nanị ‘iji aha Chineke eme ihe egwuregwu’ ka ọ pụrụ ịgụnye kamakwa “ikpeghachi ekpere na-enweghị isi.”
Oleezi otú anyị kwesịrị isi ele ekpere mgbazi nke usoro okpukpe Cabala bụ́ tikkun anya? Olee otú o si malite? Na narị afọ nke 12 na nke 13 O.A., ụdị nke okpukpe ndị Juu na-eme mgbaasị, nke a kpọrọ Cabala, malitere ịbụ nke a ma ama. Na narị afọ nke 16, Isaac Luria, bụ́ onye rabaị, webatara “tikkunim” n’ememe nke usoro okpukpe Cabala. E ji aha Chineke mee ihe dị ka ihe majik ndị mgbaasị bụ́ nke nwere ikike ndị pụrụ iche, ọ ghọkwara otu akụkụ nke ememe usoro okpukpe Cabala. Ì chere na nke a bụ iji aha Chineke eme ihe n’ụzọ ziri ezi?—Deuterọnọmi 18:10-12.
Otú ọ bụla isi zaa ajụjụ ahụ, ị ga-ekweta na ịkpọ aha Chineke n’ihu ọha nke a na-eme n’Israel nke oge a bụ nnọọ ihe a na-adịghị ahụkebe. Ma, Chineke n’onwe ya buru n’amụma, sị: “Unu ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ, Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya, meenụ ka a mara omume Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche, hotanụ na e mewo ka aha Ya dị elu. Bụkuonụ Jehova abụ ọma; n’ihi na ihe ọkaaka ka O meworo: e mewo ka a mara nke a n’ụwa nile.”—Aịsaịa 12:4, 5.
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, n’Israel, dịkwa ka ọ dị n’ihe karịrị ala 230 gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova na-etinye mgbalị nile inyere ndị agbata obi ha aka inweta ezi ihe ọmụma banyere Jehova. Olileanya ha bụ na ọtụtụ ndị mmadụ karị ka ga-abịa ghọta ihe akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Abụ Ọma 91:14 pụtara: “N’ihi na ọ hụwo m [Jehova] n’anya sie ike, m ga-emekwa ka ọ gbapụta: m ga-eme ka ọ nọrọ n’ebe dị elu, n’ihi na ọ mawo aha m.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mishnah bụ nchịkọta nke nkọwa ndị na-emeju iwu Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị dabeere ná nkọwa ndị rabaị a kpọrọ Tannaim (ndị ozizi). E deturu ya edetu ná ngwụsị nke narị afọ nke abụọ nakwa ná mmalite nke narị afọ nke atọ O.A.
[Foto dị na peeji nke 28]
N’ebe a n’ime Negeb, ndị Jehova na-eme ka a mara aha na Okwu Ya
[Foto dị na peeji nke 29]
Akwụkwọ ịma ọkwá nke na-egosi aha Chineke