Amamihe nke ‘Ibu Ụzọ Ahụ Ihe Ga-eme’
“HA BỤ ndị tụfuworo ezi uche ha, ndị na-enweghịkwa nghọta. A sị na ha maara ihe, ha ga-aghọta nke a ma buru ụzọ hụ ihe ga-eme ha.”—Deuterọnọmi 32:28, 29, Beck.
Ọ bụ Mosis gwara ụmụ Israel okwu ndị a ka ha guzo n’ókè nke Ala Nkwa ahụ. Mosis nọ na-ebu amụma banyere oge ha ga-agbakụta Jehova azụ, n’echeghịkwa echiche nke ọma banyere ihe omume ha ga-arụpụta. Na narị afọ ndị sochirinụ, ndị Israel—gụnyere ọtụtụ ndị eze—leghaara ịdọ aka ná ntị Chineke anya.
Dị ka ihe atụ, Solomọn maara iwu Chineke ahụ sịrị ka a ghara ịlụ ndị na-efe chi ndị ọzọ na-abụghị Jehova. (Deuterọnọmi 7:1-4) Ka o sina dị, ọ lụrụ “ọtụtụ ndị inyom ala ọzọ.” Gịnị ka ọ rụpụtara? Ihe ndekọ Bible na-ekwu, sị: “O ruo, na mgbe agadi Solomọn, na ndị inyom ya wezụgara obi ya ka o soo chi ọzọ: obi ya ezughịkwa okè n’ebe Jehova, bụ́ Chineke ya, nọ, dị ka obi Devid, bụ́ nna ya.” (1 Ndị Eze 11:1, 4) Ọ bụ ezie na ọ bụ nwoke maara ihe, Solomọn enweghị ezi uche nke ‘ibu ụzọ hụ ihe ga-eme’ ma ọ bụrụ na o nupụrụ iwu Chineke isi.
Gịnị banyere anyị? Anyị pụrụ izere ọtụtụ ihe mgbu ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chebara mkpebi ndị anyị na-eme ná ndụ echiche nke ọma. Dị ka ihe atụ, a na-adụ ndị Kraịst ọdụ ‘ịsachapụ n’onwe ha mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ.’ (2 Ndị Kọrint 7:1) Amamihe dị na nke a, ma ọtụtụ ndị enweghị ezi uche nke ibu ụzọ hụ ihe pụrụ ime ma ọ bụrụ na ha eleghara ndụmọdụ Pọl anya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eto eto na-emetọ ahụ ha site n’ise ụtaba, na-eche na nke a na-eme ka ha yie ndị wara anya na ndị tozuru etozu. Lee ọdachi ọ bụ na mgbe e mesịrị ná ndụ, ọtụtụ n’ime ha na-enwe nsogbu obi, ọrịa cancer akpa ume, ma ọ bụ emphysema n’ihi ya!
Ọ dị mkpa ịtụle nke ọma ihe ndị mkpebi na omume anyị ga-arụpụta. E nwere ezi ihe mere Pọl ji dee, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi; ma onye na-agha mkpụrụ nye Mmụọ Nsọ ga-esite na Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.”—Ndị Galetia 6:7, 8.