Ime Ihe Ike—Ga-akwụsị n’Isi Nso Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
“Ime Ihe Ike Na-etinye Mba n’Ihe Ize Ndụ”—The New York Times, United States.
“Ime Ihe Ike n’Ebe Obibi”—O Globo, Brazil.
“Ime Ihe Ike Na-ede Ndị Inyom Ụwa”—The Globe and Mail, Canada.
SIAKỤKỌ ndị a dị n’akwụkwọ akụkọ ndị sitere n’Ebe Ugwu na n’Ebe Ndịda America na-egosi ihe obi mgbawa na-eme n’ụwa nile. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa si kwuo na nso nso a, “ime ihe ike n’ụdị ya nile amụbawo n’ụzọ dị egwu n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya.”
Tụlee ụfọdụ ihe ndekọ na-akpali echiche:
Igbu ọchụ. Na Latin America nakwa na Caribbean, ihe dị ka mmadụ 1,250 na-anwụ ọnwụ ike kwa ụbọchị. N’ihi nke a, “n’ọkara nke mba ndị dị ná mpaghara ahụ, igbu ọchụ bụ ihe nke abụọ bụ́ isi na-akpata ọnwụ n’etiti ndị na-eto eto nọ n’afọ 15-24.”
Imeso ụmụaka ihe ike. Iti ụmụaka ihe, imetọ ha n’ụzọ mmekọahụ, na n’ụzọ mmetụta uche bụcha nsogbu ndị a na-enwe gburugburu ụwa. Dị ka ihe atụ, “nnyocha ndị e nyochara ndị toworo eto n’ọtụtụ mba ndị mepere emepe na-egosi na 10%–15% nke ụmụaka bụ ndị e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ—ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụ agbọghọ.”
Imeso ndị inyom ihe ike. Mgbe e nyochasịrị ọnọdụ ịnapụ ndị mmadụ ihe ndị ruuru ha n’ụwa nile na 1997, ndị na-eme nnyocha ekwubiwo na “ime ihe ike n’ụlọ abụrụwo otu n’ime ihe ndị bụ́ isi na-emerụ ndị inyom ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná mba nile nke ụwa.” (Human Rights Watch World Report 1998) Ime ihe ike n’ụlọ, n’ịbụ nsogbu gbasaworo ebe nile ma bụrụ nke a na-akọ ihe dị nta banyere ya, bụzi nke a na-akpọ “nsogbu na-apụtaghị ìhè nke narị afọ nke 20.”—The Globe and Mail, Canada.
N’otu aka ahụ ụwa “jupụtakwara n’ihe ike” n’ụbọchị Noa. (Jenesis 6:9-12) Ma Jehova Chineke debere “onye [ahụ] na-ekwusa ezi omume” na ezinụlọ ya ndụ “mgbe O mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Chineke ga-eme ihe yiri nke ahụ n’ụbọchị anyị. Ọ ga-echebe ‘ndị na-asọpụrụ Chineke’ mgbe ọ ga-ewepụ ndị na-eme ihe ike na ndị ajọ omume ma mee ka ụwa a ghọọ paradaịs n’ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa. (2 Pita 2:4-9; 3:11-13) Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ ịmara na ime ihe ike ga-akwụsị n’isi nso ruo mgbe ebighị ebi?