Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/15 p. 30
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Nwere Mmụọ nke Na-adịghị Anwụ Anwụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ì Nwere Mmụọ Na-adịghị Anwụ Anwụ?
    Ì Nwere Mmụọ Na-adịghị Anwụ Anwụ?
  • Ugbu A Bụ Ụbọchị Nzọpụta!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jisọs Na-azọpụta—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/15 p. 30

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

◻ N’ihi gịnị ka okwu Pọl bụ́ “ndị [nnọchianya, NW] n’ọnọdụ Kraịst” ji bụrụ nke kwesịrị ekwesị nye ndị Kraịst e tere mmanụ? (2 Ndị Kọrint 5:20)

N’oge ochie, a na-ezipụ ndị nnọchianya karịsịa n’oge ọgba aghara iji hụ ma a pụrụ igbochi agha. (Luk 14:31, 32) Ebe ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie bụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, ọ na-ezipụ ndị nnọchianya ya e tere mmanụ ime ka ndị mmadụ mara banyere ndokwa ya maka ime ka a dịghachi n’otu, na-agba ha ume ka ha chọọ udo n’ebe Chineke nọ.—12/15, peji nke 18.

◻ Ihe anọ dị aṅaa mere ka okwukwe Abraham sie ike?

Nke mbụ, o gosipụtara okwukwe n’ebe Jehova nọ site n’ịṅa ntị mgbe Chineke kwuru okwu. (Ndị Hibru 11:8); nke abụọ, okwukwe na olileanya ya nwere njikọ chiri anya (Ndị Rom 4:18); nke atọ, Abraham sooro Jehova kwurịta okwu mgbe mgbe; na nke anọ, Jehova nyere Abraham nkwado mgbe ọ gbasoro nduzi Chineke. Ihe ndị ahụ pụkwara ime ka okwukwe anyị sie ike taa.—1/1, peji nke 17, 18.

◻ Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Ewebakwala anyị n’ime ọnwụnwa” pụtara? (Matiu 6:13)

Anyị na-arịọ Chineke ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mgbe a nwara anyị ọnwụnwa inupụrụ ya isi. Jehova pụrụ iduzi anyị ka anyị ghara ịda, ka Setan, bụ́ “ajọ onye ahụ,” gharakwa imeri anyị. (1 Ndị Kọrint 10:13)—1/15, peji nke 14.

◻ Gịnị ka mmadụ na-aghaghị ime iji nweta mgbaghara Chineke maka ime ihe ọjọọ?

Ịkwa ụta na “mkpụrụ kwesịrị nchegharị” aghaghị isonyere imere Chineke nkwupụta. (Luk 3:8) Mmụọ nchegharị na ọchịchọ imezi mmejọ ahụ ga-akpalikwa anyị ịchọ enyemaka ime mmụọ nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye. (Jemes 5:13-15)—1/15, peji nke 19.

◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji gbalịsie ike ịdị umeala n’obi?

Onye dị umeala n’obi na-enwe ndidi na ogologo ntachi obi, ọ dịghịkwa eche echiche banyere onwe ya gabiga ókè. Ịdị umeala n’obi na-adọta ezi ndị enyi hụrụ gị n’anya. Karịa nke ahụ, ọ na-eweta ngọzi Jehova. (Ilu 22:4)—2/1, peji nke 7.

◻ Olee ọdịiche dị mkpa dị n’ọnwụ Jisọs na nke Adam?

Ọnwụ Adam nwụrụ kwesịrị ya, n’ihi na ọ kpachapụrụ anya nupụrụ Onye Okike ya isi. (Jenesis 2:16, 17) N’ụzọ dị iche, ọnwụ Jisọs nwụrụ ekwesịghị ya ma ọlị, n’ihi na “ọ dịghị mmehie ọ bụla O mere.” (1 Pita 2:22) Ya mere mgbe Jisọs nwụrụ, o nwere ihe dị oké ọnụ ahịa nke Adam onye mmehie ahụ na-enweghị mgbe ọ nwụrụ—ikike inwe ndụ mmadụ zuru okè. N’ihi ya, ọnwụ Jisọs bara uru dị ka àjà n’ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ.—2/15, peji nke 15, 16.

◻ N’ọhụụ amụma Ezikiel, gịnị ka obodo ahụ na-ese onyinyo ya?

Ebe ọ bụ na obodo ahụ dị n’etiti ala na-adịghị nsọ, ọ ghaghị ịbụ ihe dị n’elu ala. N’ihi ya, o yiri ka ọ na-ese onyinyo ọchịchị elu ala nke ga-abara mmadụ nile ga-emejupụta òtù ụwa ọhụrụ ahụ nke ezi omume uru.—3/1, peji nke 18.

◻ N’ihi gịnị ka Jisọs ji saa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha na-eme Ememe Ngabiga na 33 O.A.?

Jisọs adịghị eguzobe usoro ịsa ụkwụ. Kama nke ahụ, ọ na-enyere ndị ozi ya aka inwe àgwà ọhụrụ—nke ịdị umeala n’obi na ịdị njikere ịrụrụ ụmụnna ha ọrụ ndị kasị ala.—3/1, peji nke 30.

◻ Mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, gịnị dị mkpa karịa ikike ebumpụta ụwa?

Ọ bụ omume ndị anyị nwere na àgwà ime mmụọ ndị anyị zụliteworo nke ndị anyị na-amụrụ ihe pụrụ iṅomi. (Luk 6:40; 2 Pita 3:11)—3/15, peji nke 11, 12.

◻ Olee otú ndị na-ekwu okwu n’ihu ọha pụrụ isi mee ka ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ ha ka mma?

Site n’ịdị na-amụ ịgụ ihe. Ee, site n’ịgụ ihe ugboro ugboro n’olu dara ụda ruo mgbe ha nwere ike ịgụ ihe were were. Ọ bụrụ na e nwere kaseti Bible a na-ege ege, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ige ntị n’imesi echiche okwu ike na mgbanwe olu nke onye ahụ na-agụ ya ma rịba ama otú e si akpọpụta aha na okwu ndị a na-adịghị ahụkebe.—3/15, peji nke 20.

◻ Olee otú ‘mmụọ si alaghachikwuru Chineke’ mgbe mmadụ nwụrụ? (Eklisiastis 12:7)

Ebe mmụọ ahụ bụ ike ndụ, ọ ‘na-alaghachikwuru Chineke’ n’echiche nke na olileanya ọ bụla nke onye ahụ ịdị ndụ n’ọdịnihu dabeere ugbu a kpam kpam n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ iweghachi mmụọ ahụ, ma ọ bụ ike ndụ, na-eme ka mmadụ dịghachi ndụ. (Abụ Ọma 104:30)—4/1, peji nke 17.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya