Ị̀ Na-echeta?
Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
◻ N’ihi gịnị ka okwu Pọl bụ́ “ndị [nnọchianya, NW] n’ọnọdụ Kraịst” ji bụrụ nke kwesịrị ekwesị nye ndị Kraịst e tere mmanụ? (2 Ndị Kọrint 5:20)
N’oge ochie, a na-ezipụ ndị nnọchianya karịsịa n’oge ọgba aghara iji hụ ma a pụrụ igbochi agha. (Luk 14:31, 32) Ebe ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie bụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, ọ na-ezipụ ndị nnọchianya ya e tere mmanụ ime ka ndị mmadụ mara banyere ndokwa ya maka ime ka a dịghachi n’otu, na-agba ha ume ka ha chọọ udo n’ebe Chineke nọ.—12/15, peji nke 18.
◻ Ihe anọ dị aṅaa mere ka okwukwe Abraham sie ike?
Nke mbụ, o gosipụtara okwukwe n’ebe Jehova nọ site n’ịṅa ntị mgbe Chineke kwuru okwu. (Ndị Hibru 11:8); nke abụọ, okwukwe na olileanya ya nwere njikọ chiri anya (Ndị Rom 4:18); nke atọ, Abraham sooro Jehova kwurịta okwu mgbe mgbe; na nke anọ, Jehova nyere Abraham nkwado mgbe ọ gbasoro nduzi Chineke. Ihe ndị ahụ pụkwara ime ka okwukwe anyị sie ike taa.—1/1, peji nke 17, 18.
◻ Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Ewebakwala anyị n’ime ọnwụnwa” pụtara? (Matiu 6:13)
Anyị na-arịọ Chineke ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mgbe a nwara anyị ọnwụnwa inupụrụ ya isi. Jehova pụrụ iduzi anyị ka anyị ghara ịda, ka Setan, bụ́ “ajọ onye ahụ,” gharakwa imeri anyị. (1 Ndị Kọrint 10:13)—1/15, peji nke 14.
◻ Gịnị ka mmadụ na-aghaghị ime iji nweta mgbaghara Chineke maka ime ihe ọjọọ?
Ịkwa ụta na “mkpụrụ kwesịrị nchegharị” aghaghị isonyere imere Chineke nkwupụta. (Luk 3:8) Mmụọ nchegharị na ọchịchọ imezi mmejọ ahụ ga-akpalikwa anyị ịchọ enyemaka ime mmụọ nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye. (Jemes 5:13-15)—1/15, peji nke 19.
◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji gbalịsie ike ịdị umeala n’obi?
Onye dị umeala n’obi na-enwe ndidi na ogologo ntachi obi, ọ dịghịkwa eche echiche banyere onwe ya gabiga ókè. Ịdị umeala n’obi na-adọta ezi ndị enyi hụrụ gị n’anya. Karịa nke ahụ, ọ na-eweta ngọzi Jehova. (Ilu 22:4)—2/1, peji nke 7.
◻ Olee ọdịiche dị mkpa dị n’ọnwụ Jisọs na nke Adam?
Ọnwụ Adam nwụrụ kwesịrị ya, n’ihi na ọ kpachapụrụ anya nupụrụ Onye Okike ya isi. (Jenesis 2:16, 17) N’ụzọ dị iche, ọnwụ Jisọs nwụrụ ekwesịghị ya ma ọlị, n’ihi na “ọ dịghị mmehie ọ bụla O mere.” (1 Pita 2:22) Ya mere mgbe Jisọs nwụrụ, o nwere ihe dị oké ọnụ ahịa nke Adam onye mmehie ahụ na-enweghị mgbe ọ nwụrụ—ikike inwe ndụ mmadụ zuru okè. N’ihi ya, ọnwụ Jisọs bara uru dị ka àjà n’ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ.—2/15, peji nke 15, 16.
◻ N’ọhụụ amụma Ezikiel, gịnị ka obodo ahụ na-ese onyinyo ya?
Ebe ọ bụ na obodo ahụ dị n’etiti ala na-adịghị nsọ, ọ ghaghị ịbụ ihe dị n’elu ala. N’ihi ya, o yiri ka ọ na-ese onyinyo ọchịchị elu ala nke ga-abara mmadụ nile ga-emejupụta òtù ụwa ọhụrụ ahụ nke ezi omume uru.—3/1, peji nke 18.
◻ N’ihi gịnị ka Jisọs ji saa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha na-eme Ememe Ngabiga na 33 O.A.?
Jisọs adịghị eguzobe usoro ịsa ụkwụ. Kama nke ahụ, ọ na-enyere ndị ozi ya aka inwe àgwà ọhụrụ—nke ịdị umeala n’obi na ịdị njikere ịrụrụ ụmụnna ha ọrụ ndị kasị ala.—3/1, peji nke 30.
◻ Mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, gịnị dị mkpa karịa ikike ebumpụta ụwa?
Ọ bụ omume ndị anyị nwere na àgwà ime mmụọ ndị anyị zụliteworo nke ndị anyị na-amụrụ ihe pụrụ iṅomi. (Luk 6:40; 2 Pita 3:11)—3/15, peji nke 11, 12.
◻ Olee otú ndị na-ekwu okwu n’ihu ọha pụrụ isi mee ka ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ ha ka mma?
Site n’ịdị na-amụ ịgụ ihe. Ee, site n’ịgụ ihe ugboro ugboro n’olu dara ụda ruo mgbe ha nwere ike ịgụ ihe were were. Ọ bụrụ na e nwere kaseti Bible a na-ege ege, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ige ntị n’imesi echiche okwu ike na mgbanwe olu nke onye ahụ na-agụ ya ma rịba ama otú e si akpọpụta aha na okwu ndị a na-adịghị ahụkebe.—3/15, peji nke 20.
◻ Olee otú ‘mmụọ si alaghachikwuru Chineke’ mgbe mmadụ nwụrụ? (Eklisiastis 12:7)
Ebe mmụọ ahụ bụ ike ndụ, ọ ‘na-alaghachikwuru Chineke’ n’echiche nke na olileanya ọ bụla nke onye ahụ ịdị ndụ n’ọdịnihu dabeere ugbu a kpam kpam n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ iweghachi mmụọ ahụ, ma ọ bụ ike ndụ, na-eme ka mmadụ dịghachi ndụ. (Abụ Ọma 104:30)—4/1, peji nke 17.