“Zụlite Nwata”
INWE ihe ịga nke ọma n’ịkọ ubi na-achọ ihe karịrị nnọọ ịkụnye mkpụrụ n’ala ma lọghachi n’ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị maka iwe ihe ubi. Ọ chọrọ ịrụsi ọrụ ike nke ukwuu n’ịkwadebe ala, ịkụ mkpụrụ, na ịkwọsa ihe ọkụkụ ndị ahụ mmiri na ilekọta ha ka ha wee nwee ike itozu okè.
Usoro a pụrụ igosi ịbụ eziokwu nke Ilu 22:6, nke na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya sị dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” N’ezie, ọzụzụ sitere n’aka ndị mụrụ ụmụ bụ isi ihe dị n’inwe ihe ịga nke ọma n’ịzụ ụmụ.
Otú ọ dị, n’ụwa taa nke na-eme ihe masịrị ya, ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ adịghị ege ntị na ndụmọdụ a. Mgbe ha gbasoro amamihe e nwere n’ọha bụ́ na ụmụaka aghaghị ịmụta idozi nsogbu n’onwe ha, ha na-ahapụ ụmụ ha mgbe mgbe ilekọta onwe ha. Ụzọ dị otú ahụ na-eme ka ndị na-eto eto bụrụ ndị mmetụta na-emerụ ahụ nke mmadụ ndị n’enweghị ụkpụrụ pụrụ imetụta.—Ilu 13:20.
Lee ka o si ka mma ndị mụrụ ụmụ ịkụnye ụkpụrụ ndị Kraịst n’ime ụmụ ha site n’ọzụzụ Chineke n’oge ha ka bụ ụmụntakịrị! Olee mgbe a ga-amalite? ‘N’oge ha dị na nwa ọhụrụ,’ ka Pọl onyeozi na-ekwu. Nke ahụ bụ otú ọ dị n’ihe banyere nwa okoro ahụ bụ́ Timoti. Nne ya, bụ́ Yunaịsị, na nne nne ya bụ́ Lọis kụnyere “ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ” n’ime Timoti nke mere na ọ “mụtara,” e “mekwara ka [o] kwere ha.” Gịnị si na ya pụta? Ọzụzụ dị otú ahụ keere òkè dị oké mkpa n’ime ka ọ bụrụ “onye amamihe ịnata nzọpụta.”—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.
N’otu aka ahụ taa, ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị ‘ike na-adịghị agwụ n’ime ihe ọma,’ ga-enweta ụgwọ ọrụ bara ụba ma ọ bụrụ na ha “adaghị mbà.” (Ndị Galetia 6:9) Eze Solomon nwere amamihe na-ekwu, sị: “Nna nke onye ezi omume ga-etegharị egwú ọṅụ nke ukwuu.”—Ilu 23:24.