Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 2/1 p. 32
  • “Zụlite Nwata”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Zụlite Nwata”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 2/1 p. 32

“Zụlite Nwata”

INWE ihe ịga nke ọma n’ịkọ ubi na-achọ ihe karịrị nnọọ ịkụnye mkpụrụ n’ala ma lọghachi n’ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị maka iwe ihe ubi. Ọ chọrọ ịrụsi ọrụ ike nke ukwuu n’ịkwadebe ala, ịkụ mkpụrụ, na ịkwọsa ihe ọkụkụ ndị ahụ mmiri na ilekọta ha ka ha wee nwee ike itozu okè.

Usoro a pụrụ igosi ịbụ eziokwu nke Ilu 22:6, nke na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya sị dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” N’ezie, ọzụzụ sitere n’aka ndị mụrụ ụmụ bụ isi ihe dị n’inwe ihe ịga nke ọma n’ịzụ ụmụ.

Otú ọ dị, n’ụwa taa nke na-eme ihe masịrị ya, ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ adịghị ege ntị na ndụmọdụ a. Mgbe ha gbasoro amamihe e nwere n’ọha bụ́ na ụmụaka aghaghị ịmụta idozi nsogbu n’onwe ha, ha na-ahapụ ụmụ ha mgbe mgbe ilekọta onwe ha. Ụzọ dị otú ahụ na-eme ka ndị na-eto eto bụrụ ndị mmetụta na-emerụ ahụ nke mmadụ ndị n’enweghị ụkpụrụ pụrụ imetụta.—Ilu 13:20.

Lee ka o si ka mma ndị mụrụ ụmụ ịkụnye ụkpụrụ ndị Kraịst n’ime ụmụ ha site n’ọzụzụ Chineke n’oge ha ka bụ ụmụntakịrị! Olee mgbe a ga-amalite? ‘N’oge ha dị na nwa ọhụrụ,’ ka Pọl onyeozi na-ekwu. Nke ahụ bụ otú ọ dị n’ihe banyere nwa okoro ahụ bụ́ Timoti. Nne ya, bụ́ Yunaịsị, na nne nne ya bụ́ Lọis kụnyere “ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ” n’ime Timoti nke mere na ọ “mụtara,” e “mekwara ka [o] kwere ha.” Gịnị si na ya pụta? Ọzụzụ dị otú ahụ keere òkè dị oké mkpa n’ime ka ọ bụrụ “onye amamihe ịnata nzọpụta.”—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.

N’otu aka ahụ taa, ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị ‘ike na-adịghị agwụ n’ime ihe ọma,’ ga-enweta ụgwọ ọrụ bara ụba ma ọ bụrụ na ha “adaghị mbà.” (Ndị Galetia 6:9) Eze Solomon nwere amamihe na-ekwu, sị: “Nna nke onye ezi omume ga-etegharị egwú ọṅụ nke ukwuu.”—Ilu 23:24.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya