Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
E Nyeghachi Ọchịchọ A Chọrọ Ezi Chineke ahụ Ụgwọ Ọrụ
NA NARỊ afọ nke iri T.O.A., e ji ofufe ụgha mejupụta alaeze ebo abụọ nke Juda. Otú ọ dị, n’etiti ikpere arụsi a ka otu nwoke nke obi ya ziri ezi n’ebe Chineke nọ, bi. Aha ya bụ Jehoshafat. Jihu onye amụma kwuru banyere ya, sị: “A chọtawo ezi ihe n’aka gị, n’ihi na i . . . [doziwo] obi gị ịchọ Chineke.” (2 Ihe E Mere 19:3) N’otu aka ahụ taa, ‘n’oge ndị a dị oké egwu,’ ọtụtụ nde mmadụ ‘edoziwo obi ha’ ịchọ ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. (2 Timoti 3:1-5) Ahụmahụ na-esonụ nke sitere Togo, n’Ọdịda Anyanwụ Africa, gosipụtara nke a.
Casimir gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik ma nata Oriri Nsọ mbụ ya mgbe ọ dị afọ itoolu. Otú ọ dị, mgbe ọ dị afọ 14, Casimir akwụsịla ịga chọọchị. Nke a kpataara ya ibi ndụ n’egwu n’ihi na o chere na ịhapụ Mas ga-eme ka ọ gaa hel na-ere ọkụ, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, pọgatrị.
N’ụlọ akwụkwọ, Casimir sonyeere otu ìgwè ndị ntorobịa bụ́ ndị na-ezukọta otu ugbo n’izu iji mụọ Bible. Ọ malitekwara ịgụ Bible n’onwe ya. N’otu oge Casimir gụtara n’akwụkwọ Mkpughe banyere otu anụ ọhịa dị egwu nke si n’oké osimiri rịgopụta. (Mkpughe 13:1, 2) Mgbe ọ jụrụ onye ndú nke ìgwè ọmụmụ Bible ahụ banyere ya, a gwara ya na anụ ọhịa ahụ bụ anụ ọhịa nkịtị nakwa na ọ ga-esi n’oké osimiri rịgopụta n’ezie. Nkọwa a nyere Casimir nsogbu n’ihi na o bidewere Ụsọ Oké Osimiri Atlantic. O kwenyesiri ike na ya ga-eso ná ndị mbụ anụ ọhịa ahụ ga-egbu.
Casimir malitere idewe ego ya ka o wee nwee ike ịgbalaga n’ọzara n’ebe ugwu iji zere anụ ọhịa ahụ. Ọ gwara otu nwa klas ya banyere atụmatụ ya. N’ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nwa klas ya ahụ mesiri ya obi ike na ọ dịghị anụ ọhịa nkịtị dị otú ahụ ga-esi n’oké osimiri rịgopụta. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, a kpọrọ Casimir òkù ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nzukọ ndị ahụ tọrọ ya ụtọ, ọ malitekwa ịbịachi anya. Ọ nakwerekwara ọmụmụ Bible ebe obibi.
Ka Casimir na-enwe ọganihu n’ọmụmụ ihe ya, mmegide ezinụlọ malitere. Ezinụlọ ya na-efe ofufe ndị nna ochie, na-erikwa anụ a na-egbupụghị ọbara bụ́ nke a chụfọrọ n’àjà. Mgbe Casimir ji nkwanye ùgwù kwụsị iri anụ ahụ, e yiri ya egwu ma gwa ya ka o si n’ụlọ ha pụọ. Casimir nọdụrụ nwayọọ, ha emeghịkwa ihe ahụ ha yiri n’egwu. Otú ọ dị, ruo ọnwa atọ, nanị anụ dị otú ahụ ka e ji sie nri ezinụlọ ha. Casimir nwere nsogbu nke inweta ihe oriri ga-ezuru ya, ma ọ tachiri obi na nke a na ihe isi ike ndị ọzọ.
Casimir nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ ruo n’ókè nke nraranye na baptism. Mgbe e mesịrị, a họpụtara ya dị ka ohu na-eje ozi, ọ gakwara klas nke anọ nke Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi e nwere na Togo. Ka ọ dị ugbu a, ọ na-anụ ụtọ ịrụ ọrụ afọ ofufo n’alaka Togo.
Ee, lee ka okwu Eze Devid siworo bụrụ eziokwu n’ọtụtụ ọnọdụ: “Ọ bụrụ na ị chọọ [Jehova], Ọ ga-eme ka ị chọta Ya.”—1 Ihe E Mere 28:9.
[Foto dị na peeji nke 8]
Casimir (n’aka nri) na-anụ ụtọ ọrụ afọ ofufo n’alaka Togo