Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/1 p. 29
  • Onye Bụbu Onye Mmegide Amụta Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Bụbu Onye Mmegide Amụta Eziokwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mụta Ihe n’Aka Nwanne Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ì Nwere Ọnụ Ọgụgụ Magazin Ị Na-ewere Mgbe Nile?
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/1 p. 29

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Onye Bụbu Onye Mmegide Amụta Eziokwu

A KỌWO ọtụtụ ihe n’akụkọ banyere agha obodo ahụ a lụrụ na Liberia. Ọtụtụ iri puku tụfuru ndụ ha, a chụgakwara ọbụna ihe ka ukwuu n’ala ọzọ. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị a, ndị nwere obi eziokwu na-anọgide na-anata eziokwu ahụ, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosi.

Site na mgbe ọ dị afọ iri, Chọọchị Lutheran kụziiri James akwụkwọ. Mgbe ọ ghọsịrị onye nchịkọta akụkọ nke otu ihe odide chọọchị, o jiri ọnọdụ ya mee ihe ide ihe megide Ndịàmà Jehova. Nke a bụ n’agbanyeghị eziokwu bụ́ na o zutetụbeghị otu n’ime ha.

Ka oge na-aga, James hapụrụ ihe odide chọọchị ahụ ma ghọọ onye nwere họtel ihe na-agara nke ọma. Otu ụbọchị, ka ọ nọdụrụ ala n’ebe nnabata ndị ọbịa nke ụlọ ndị ọbịa ya, ụmụnna nwanyị abụọ jiri ejiji nke ọma kpọtụụrụ ya. N’ịhụ uwe ha dị ọcha, ọ kpọbatara ha. Ma mgbe ha kọwara nzube ha ji bịa, ọ sịrị, “Eji m ọrụ n’aka nke na apụghị m ikwu okwu.” Ndịàmà ahụ nyefere ya ụtụ magazin Ụlọ Nche na Teta!, ọ natakwara ya nanị iji mee ka ha pụọ. Magazin ndị ahụ bịara n’ebe obibi ya ruo ọnwa 12, ma o tinyere ha n’akpa plastik n’ewepụdịghị ihe ndị e ji fụchie ha.

Agha obodo nọ na-akpọtụ, ya mere James tinyejuru ego na ihe ndị bara uru n’otu akpa iji gbapụ n’ihe àmà mbụ nke mwakpo. Otu ụtụtụ otu grenade gbawara n’azụ ọnụ ụzọ azụ ụlọ ya, n’ịma jijiji o buuru akpa ya ma gbaa ọsọ maka ndụ ya. N’isonyere ọtụtụ puku ndị nkịtị na-agbalaga agbalaga, ọ ghaghị ịgafe ọtụtụ ebe a na-enyocha ndị mmadụ. N’ebe ahụ, a na-ezu ndị nkịtị aka ha dị ọcha ohi ma gbuo ha mgbe mgbe n’enweghị nnọọ ihe kpatara ya.

N’ebe mbụ a na-enyocha ndị mmadụ, a jụrụ James ajụjụ ole na ole ma gwazie ya ka o meghee akpa ya. Mgbe o meghere ya, o lebara anya n’ime akpa ya, ọ pụghịkwa ikwere ihe ọ hụrụ. Egwu tụrụ ya mgbe ọ hụrụ na akpa ahụ o butere abụghị nke ahụ ihe ya ndị bara uru dị. N’ahụ ịma jijiji, o buruwo akpa ahụ magazin Ụlọ Nche na Teta! nile ahụ ọ na-emepebeghị emepe dị na ya. Otú ọ dị, mgbe onye soja ahụ hụrụ magazin ndị ahụ ma gụọ aha ya n’akwụkwọ ndị ahụ a mapawara na ha, ọ sịrị: “Oo, ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Anyị anaghị achọ unu, anyị maara na unu adịghị agha ụgha.” Mgbe o wepụtasịrị magazin ole na ole n’akpa ahụ, onye soja ahụ gwara James ka ọ gawa.

Otu ihe ahụ mere n’ebe itoolu dị iche iche a na-enyocha ndị mmadụ, ka ndị ọchịagha ahụ nile weere ya na James bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma kwere ka ọ gafee n’emerụghị ahụ. James nwere ekele ugbu a na ya ebuteghị ihe ya ndị bara uru n’ihi na site n’ihe ọ hụworo, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka na a gaara egbuwo ya maka ihe onwunwe ya.

Mgbe o mesịrị rute ebe ikpeazụ a na-enyocha ndị mmadụ nakwa nke a kasị atụ ụjọ, o riri ya izizi n’ahụ ịhụ ọtụtụ ozu ndị tọgbọcha n’ala. N’ịbụ onye ụjọ jidere, ọ kpọkuru aha Jehova. O kpere ekpere na ọ bụrụ na Chineke ga-enyere ya aka ịgafe ebe a a na-egbu mmadụ, na ya ga-ejere ya ozi ná ndụ ya fọdụrụnụ.

James gosiri ndị soja ahụ akpa ya, ọzọkwa ha sịrị: “Anyị anaghị achọ ndị a.” N’ichigharịkwuru ya, ha gbakwụnyere, sị: “Otu n’ime ụmụnna gị nwoke bi na ndịda ugwu a. Gaa nọnyere ya.” Ka ọ na-erule ugbu a, echiche James banyere Ndịàmà agbanwewo kpam kpam. Ọ kpọtụụrụ nwanna nwoke ahụ ozugbo, e mekwara ndokwa maka ọmụmụ Bible n’akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs n’Elu Ala.a

Ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, otu mwakpo manyere ya isi n’ógbè ahụ gbapụ. Na nke ugbu a, James gbabara n’ime ọhịa na-ejidesi nanị akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi ya ike! N’ime ọnwa 11 nke esoghị Ndịàmà nwee mmekọrịta, ọ mụchara akwụkwọ ya ugboro ise. Mgbe o mesịrị nwee ike ịlọghachi n’obodo ahụ, ọ maliteghachiri ọmụmụ Bible ya na Ndịàmà ma nwee ọganihu dị ngwa. Ná mkpirikpi oge mgbe e mesịrị, e mere ya baptism, o sokwa ụmụnna ime mmụọ ya na-eje ozi ugbu a n’ikwesị ntụkwasị obi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya