Ndị Ụkọchukwu Nile Hà Kweere Ihe Ha Na-akụzi?
DI NWANYỊ ahụ ka nwụrụ ọhụrụ. Ụkọchukwu ya kọwara na di ya abụrughị ezi mmadụ nke ịga eluigwe kpọmkwem ma ọ bụ ajọ mmadụ nke itinye ya n’ọkụ nke hel. Ya mere, dị ka ụkọchukwu ahụ si kwuo, ọ na-anara ntaramahụhụ ruo mgbe o ruru eru maka eluigwe. Ọ na-akwụ ụkọchukwu ahụ ụgwọ ikpe ekpere ka e wee nwee ike tọhapụ di ya na pọgatrị n’oge na-adịghị anya. Nke a juru nwanyị ahụ di ya nwụrụ afọ, na-eche na ụkọchukwu ahụ so ya kwere n’ihe ahụ o ji ezi obi kwere.
Ì chere na nwanyị ahụ di ya nwụrụ ga-enwe nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na ọ chọpụta na ụkọchukwu ya ekwenyeghị n’ezie na ntaramahụhụ mgbe a nwụsịrị? Ọ na-enye ọtụtụ nsogbu n’obi ịchọpụta na ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị ụkọchukwu ekwenyeghị n’ihe dị ukwuu n’ime ihe ha onwe ha na-akụzi. Akwụkwọ akụkọ bụ́ National Catholic Reporter, ka ọ na-ekwu banyere ihe ọ kpọrọ “otu nsogbu ka njọ nke ndị ụkọchukwu karịa mmekọahụ rụrụ arụ,” kwuru, sị: “N’etiti ndị ụkọchukwu n’ozuzu ha, e nwere ọtụtụ ndị kwụsịworo ikwenye n’ịdị adị nke Chineke ma ọ bụ n’ozizi nke ụgwọ ọrụ na ntaramahụhụ ma ọ bụ mbilite n’ọnwụ . . . nke na òtù ndị ụkọchukwu nwere ekwenyeghị ekwenye nke a dị ka akụkụ nke àgwà ya nke yitụrụ oké anwụrụ ọkụ.”
Chọọchị ndị ọzọ na-eche nsogbu siri ike yiri nke ahụ ihu. Otu njụta echiche e mere ndị ụkọchukwu nke Chọọchị England kpughere na ọtụtụ “ekwenyeghị n’ihe ndị bụ́ isi nke nkwenkwe ọdịnala ndị Kraịst dị ka ọmụmụ nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ọrụ ebube dị iche iche nke Jisọs na ọbịbịa nke abụọ nke Mesaịa,” ka akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ Canberra Times na-akọ.
Onye edemede banyere okpukpe bụ́ George R. Plagenz jụrụ ajụjụ banyere otú onye okwuchukwu pụrụ isi jiri ezi akọ na uche na-agụghachi ụkpụrụ okwukwe nke ọ na-ekwenyeghị na ya. Otu onye okwuchukwu kwuru na nanị ihe ya na-eme bụ na ya na-eji okwu ọzọ dochie anya okwu mmalite nke ụkpụrụ okwukwe ahụ, bụ́ “Ekwe m.” O kwuru, si: “Ana m amalite ụkpụrụ okwukwe ahụ site n’ikwu sị, ‘Ekwe HA na Chukwu Nna nke Pụrụ Ime Ihe Nile . . .’” Plagenz kpọrọ ihu abụọ dị otú ahụ “wayo kasị ukwuu ná mba a.”
N’ụzọ dị mwute, ekwenyeghị ekwenye na ihu abụọ dị otú ahụ nke ndị ụkọchukwu na-eme ka ọtụtụ ndị nwee nkụda mmụọ banyere okpukpe n’ozuzu ya. Ma ọ bụghị nanị ya bụ akụkụ okpukpe nke na-enye nsogbu n’obi taa. A kụziworo ihe ka ọtụtụ ná ndị na-aga chọọchị na Bible bụ Okwu Chineke. Ọ̀ ga-eju ha anya ịmata na a kụzighị ụfọdụ ozizi chọọchị ndị ha nakwewooro ruo ogologo oge na Bible? Isiokwu na-esonụ ga-atụle otu ihe atụ.